Imo state news today: Ụmụnne atọrọla nna ha dị afọ 88

Uweojii Naijiria

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị

Aka akparala ụmụnne abụọ aha ha bụ Chinaza Nwogu na Emeka Ejike nakwa enyi ha nwoke bụ Emmanuel dịka ha tọrọ nna ha dị afọ iri asatọ na asatọ n'Imo steeti.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Frank Mba gwara ndị ntaakụkọ na ndị otu ya nọ n'Imo steeti nwụchiri ha n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa June ka mmadụ zitechara ha ozi.

Kedụ ka o si mee?

Mba kwuru na enyi ụmụnne abụọ ahụ akpọrọ Emmanuel kwadoro iji ego ọ ga-eketa na ya bụ ntọ nna ha we bịa lụrụ otu onye n'ime ha.

O kwuru na a na-eche na mmadụ atọ a na-atọbu ndị mmadụ maka ịnapụta ego na mpaghara Mbaise.

N'ebe ọzọ n'Imo steeti

Mba kwukwara na ndị uweojii tọghapụrụ ndị mmadụ ndị ntọ ji ruru iri na atọ n'ọhịa Ohaji/Egbema dị n'Imo steeti.

O kwuru na ndị uweojii gburu ndị ntọ atọ ka ha na ha kwachara mgbọ n'ọhịa ahụ ruo awa asatọ.

Mba kwuru na ha nwụchiri otu onye a na-eche na o gburu nwa ada ka fechara ala nna ya na Naịjirịa ka ọ wakpochara ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Etu nwoke akpọrọ "Nigeria's Supercop" ji ebuso ndị ntọ na ndi ojieegbe ezu ohi agha na Naịjirịa.