Sanusi Lamido Sanusi: Ụgbọelu eburula Eze Kano a chụrụ achụ si obodo Loko gawa Awe

Ụgbọelu bu Sanusi Lamido Sanusi

Dịka a na-eche ihe ga-eme ugbua a chuturu onye bụbu Eze Kano bụ Mohammad Sanusi nke abụọ n'oche, ụgbọelu helikọpta abịala bịa buru ya si obodo Loko pụọ.

Obodo Loko dị na Nasarawa steeti bụ ebe a chụgara Sanusi oge e si Kano chụpụ ya.

Iwu gọọmentị Kano nyere machiri Sanusi ịbata steeti ahụ ruo oge ọnwụ ya.

Ụlọ ebe e dugara Sanusi ka a chụpụrụ ya n'ọkwa oche ya

Otu onye so na ndị na-achi obodo Loko bụ Abubakar Ahmed Sabo gwara BBC na ihe mere e jiri kpọpụ Sanusi bụ maka na ụlọ e nyere ya n'obodo Loko ekwesịghị ekwesị maka nnukwu mmadụ dị ka ya.

Ụlọ ebe e dugara Sanusi ka a chụpụrụ ya n'ọkwa oche ya

"Ọ bụ sọsọ akupe latrik dị n'ulo e nyere Sanusi na Loko. Ụlọ dị n'Awe ka mma."

Ụlọ ebe e dugara Sanusi ka a chụpụrụ ya n'ọkwa oche ya

Onye ntaakụkọ BBC si na mkpọpụ Sanusi sitere na nzukọ ndị ọchịchị ọdịnala mere n'ụtụtụ were kpebie na ekwesiri ịkpọ ya gaa ebe ka mma.

Ka ọdị ugbua, ndị ọkaiwu Sanusi na-agba izu ịgbagha ya bụ ihe mere n'ụlọikpe.

Ndí ọkaiwu Sanusi
Nkọwa foto, Ndị ọkaiwu Sanusi kwuru na ihe e mere ya ezighi ezi n'iwu.
Akara ntụ-ntụ

Sanusi sị na ya anabatala ọchụchu achụru ya n'ọkwa

sanusi

Ebe foto si, Getty Images

N'ihe onyonyo o weputere n'abali unyaahụ, Eze Lamido Sanusi nke abụọ ekwuola na ọ bụ uche chukwu mere n'ebe ọ nọ dịka ọ na-anabata ọchụchụ achụrụ ya n'oche.

Sanusi sị ka ndị na-akwado ya bie n'udo ma kwado Eze ọhụrụ Kano bu Aminu Ado Bayero etu ha siri kwado ya.

Nke a na-abịa ka ewepuru ya n'oche nna nna ya ma chụpụ ya na Kano.

Akara ntụ-ntụ

A nwụchiela otu onye maka ebubo ịtọrọ nwa ọhụrụ n'Ohafia

Nwa nọ n'azụ nne ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwa nọ n'azụ nne ya (Ọ bụghị nwata a ka akụkọ a na-ekwu maka ya)

Ndi uweojii na Pọtakọtụ ekwuola na aka akparala otu onye so na ndị ana-enyo enyo maka ebubo ịtọrọ nwa ọhụrụ n'obodo Ohafia dị n'Abịa steeti gbalaa Pọtakọtụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rivers bụ Omoni Nnamdi kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo.

Nnamdi agwaghị anyị onye ahụ a nwụchiri, mana akụkọ na-ekwu na ọ bụ nwanne nwaanyị ahụ a na-enyo enyo maka izuru nwa ahụ.

O kwukwara na ha na-agba mbọ ịnwuchi nwaanyị ahụ n'oge adịghị anya.

Akụkọ kọrọ na nwaanyị ahụ ji nnọọ olu ọma wee kuru nwa ahụ n'aka nne ya tupu o were ụzọ aghụghọ kuru ya gbafuo.

Ya bụ ihe mere n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị, mana e butere okwu ahụ n'ụlọọrụ ndị uweojii n'abalị asaa nke Maachị.

Akara ntụ-ntụ

Ị ma na e nwere ike ịgwọta ọrịa HIV?

Onye a chọrọ inyocha ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwoke na London abụrụla onye nke abụọ a na-agwọta maka ọrịa HIV na ụwa.

A chọpụtara na nwoke a aha ya bụ Adam Castillejo enweghịzi HIV ka ọ gachara ọnwa iri atọ ọ natara ọgwụgwọ a kpọrọ 'stem-cell-treatment' maka ọrịa Cancer.

Adam Castillejo gbara afọ iri anọ ugbua

Ebe foto si, ANDREW TESTA/NEW YORK TIMES/REDUX/EYEVINE

Nkọwa foto, Adam Castillejo gbara afọ iri anọ ugbua

Ọ gaala otu afọ nje HIV pụrụ n'ahụ Castillejo na-agbanyeghị na ọ naghị aṅụzi ọgwụ ọrịa ahụ.

Mana 'stem cell treatment' bụ ọgwụgwọ maka cancer, ọbụghị nke HIV

Onye nke mbụ a gwọrọ HIV bụ Timothy Brown n'obodo Berlin dị na mba Jamanị n'afọ 2011.

Brown bụkwa 'stem cell treatment' ka ọ natara tupu ọ chọpụta na ọrịa HIV ya alaala.

Akara ntụ-ntụ

Okporoụzọ n'Itali tọgbọrọ chakoo dịka atụmatụ 'quarantine' malitere ebe niile

Itali

Ebe foto si, AFP

Dịka ọrịa Coronavirus na-akpa mkpamkpa na aga n'ụwa, Ịtali agbasaala mgbochi ọpụpụ na mbata obodo ha ebe niile.

Nke a mere dịka ihe karịrị mmadụ 460 nwụrụ maka nje a, ebe mmadụ puku itoolu bu ya.

Mgbochie a ha tinyere bụ nke kachasị kemgbe anụchara agha mba ụwa nke abụọ.

Mgbochi a metụtara ndị mmadụ ịgbakọ n'igwe ma sịkwa na onye ọbụla chọrọ ịga njem ga-anata ikike.

Nke a na-eme ka Singapọ bụrụla malitegoro ịna ego maka ịgwọ ya bụ ọrịa maka ngobata ndị bụ ya bụ ọrịa na-egobata be ha maka agwụm ọrịa ahụ.

Mba Ịtali

Ebe foto si, AFP/Getty Image

Ọzọ dịka ibe ya bụrụ n'Afrịka otu nwoke eriela mbọmbọ ọsọ na Zimbabwe ka abịara ịyoche ya ahụ maka ya bụ ọrịa Coronavirus.

Minista ahụike mba ahụ sị na ya bụ nwoke gbara afọ iri abụọ na isii sị mba Thailand bata ala ahụ na ngwụcha Febuwarị.

Akara ntụ-ntụ

N'egwuregwu

Leicester City vs Aston Villa

Ebe foto si, European Photopress Agency

N'egwuregwu, Leicester City ewerela ọkpụ goolu anọ pịa Aston Villa ụtarị na be ha n'asọmpị Premia Lig agbara ụbọchị Monde.

Barnes na Vardy nyere goolu abụọ abụọ ji sị ndị Aston Villa ha laa n'udo.

Gee akụkọ ndị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri maka nwaagbọghọ Igbo na-anya Ugboelu

Aha onyonyo, Female Pilot: O nweghị ihe ọzọ m kaara ịme karịa ịnya ụgbọelụ

Akụkọ ga-amasị gị