Child Trafficking: Etu dị na nwunye zụtara ụmụaka abụọ si ma n'ọnya ndị uweojii

Ebe foto si, Nigeriaa Police
Aka ndị uweojii akparala di na nwunye a na-ebo ebubo ịzụ ụmụntakịrị nwoke abụọ.
Onye kwuru nke a bụ Bala Elkana, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs Steeti.
Elkana kwuru na aha di na nwunye a bụ Chukwunonso Blessing na Chukwunonso Happiness.
Dịka Elkana si kwuo, aka kpaara Blessing na akụkụ ahịa dị n'Alaba mgbe ọ chọrọ ịkpọ ụmụaka abụọ ahụ banye ụgbọala na-aga Ọnịcha.

Ebe foto si, Chukwunaeme Obiejesi
Aha ụmụaka ahụ bụ Joshua James na Samuel Gbawune.
Ha abụọ gbara afọ isii na afọ atọ n'otu n'otu.
Blessing kwuru na ọbụ di ya kutere ụmụaka abụọ ahụ n'ụlọ ụmụaka enweghị nne na nna nke dị na Jos, Platu steeti.
Mana mgbe aka uwojii kpatara di ya bụ Happiness, ọ sara asịsa na ọ zụrụ ụmụaka ahụ azụ.
Onye resiri ya ụmụaka ahụ bụ nwaanyị a na-akpọ Mama Oyoo n'ọnụ dị otu narị puku na puku iri anọ (N140,000).
Elkana kwuru na ndị uweojii na-agbazị mbọ ịchọta ezinụlọ ụmụaka ahụ ka ha nyeghachi ha ụmụ ha.
Mmepe 'border' agaghị abụ n'afọ a

Ebe foto si, Reuters
Naịjirịa agaghị emeghe oke ala ya na mba ndị gbara ya okirikiri ruo ọnwa Janụwarị nke afọ 2020.
Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ nke a.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ 'Channels TV' si kwuo, akwụkwọ ozi kwupụtara nke a pụtara n'abalị mbụ nke ọnwa Novemba.
Onye dere ya bụ Victor Dimka, onye jị ọkwa 'Comptroller (Enforcement)' na ngalaba 'Nigeria Customs Service'.
Ọ kọwara na ihe e ji gbatịa oge a ga-emepe oke ala Naịjirịa bụ maka na ha chọpụtara na mmechi a e mechiri ya mịtara nnukwu mkpụrụ.
Dimka gara n'ihu kwuo na ọ ka nwere ihe ha chọrọ ịnweta na ya bụ mmech 'border'.
Nke a na-abịa na-agbanyeghị akwa ndị mmadụ na-ebe maka oke ahụhụ nke kwuru na mmechi 'border' butere.
Mana gọọmentị na-ekwu na mmechi oke ala ga-eme ka ndị mmadụ zụwa ihe ndị emepụtara na Naịjirịa nke ga-eme ka akụnụba gbalie.
Akpachaghị anya, APC ga-akụ afọ n'ala n'afọ 2023 - Okorocha

Ebe foto si, Lauretta Onochie
Sịnetọ na-achịteanya Imo West bụ Rochas Okorocha akatọọla ihe na-eme n'ime ụlọ pati ya bụ APC ma kwuo na nke a nwereike imegide ha na ntuliaka 2023.
Rochas kwuru nke a na Kano n'ụbọchị Satọde n'ihi nsogbu dị n'etiti onyeisoche APC bụ Adams Oshiomole na gọvanọ Edo Steeti bụ Godwin Obaseki.
O kwuru na Pati ọbụla na-ebuso onwe ya agha e tozughi ịbụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ọ ga-aghị akwụli chịm.
Okorocha sị na APC agbahapụla usoro e jiri hiwe ya n'afọ 2015 nke nyere ikike ha ji na-apụ PDP ọchịchị na ntuliaka afọ ahụ.
Na ọ bụ agwa nakwa ugwu onyeisiala Buhari wetara n'APC bụ ihe ha jiri malite mana ọ dị ka "aka ịkụ ngwọ Sebasten agbanweela".
Na nke a nwereike inye ha nsogbu n'afọ 2023 dịka onyeisiala Buhari ga-arịtu n'ọkwa.
N'okwu ya "ọ bụrụ ma a kpachaghị anya, APC ga-esoro onyeisiala Buhari laa n'afọ 2023, ọ ga-abụ ihe ọjọọ nye ndị hiwere ya".
Okorocha gara n'ihu nye ndụmọdụ ka ndị APC were aka ahụ ha ji malite n'afọ 2015.
Atụmatụ mgbochi ịbanye otu nzuzo
Ndị uweojii n'Enugwu state ga-akpaghari okirikiri Enugwu niile n'abalị asaa nke ọnwa Dịsemba iji dọọ ndị mmadụ tụmadị ndị na-eto eto aka na ntị ka ha zeere ịbanye otu ọjọọ.
Ebere Amrizu bụ okwuru ọra ndị uweojii na steeti ahụ bụ kwupụtara nke a.
Amarizu kwuru na mkpagharị a so n'atụmatụ a kpọrọ Police Campaign Against Cultism and Other Vices.
Ndị na-akwado atụmatụ a gunyere Nkem Owoh, Patience Ozokwor na ndị ọzọ.
N'akụkọ yiri ibe;

Ebe foto si, Getty Images
Otu jikọtara ndị ọkaiwu bụ Nigerian Bar Association akpọọla oku ka a tọhapụ onye otu ha bụ ọkaikpe Chioma Iheme-Nwosu a tọrọ n'Edo Steeti n'izuụka gara aga.
Onyeisi otu a bụ Paul Usoro gwara ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ n'ihi nke a.
Otu NBA etiela mkpu maka onye otu ha a tọọrọ

Onyeisioche pati APC bụ Adams Oshiomole ekwuola na ndị wakporo gọvanọ Obaseki nke Edo Steeti na ndị ọzọ n'ụlọ ya bụ ndị na-arụrụ osote gọvanọ Philip Shaibu ọrụ.
Oshiomole kwuru nke a site n'ọnụ odeakwụkwọ ya bụ Simon Ebegbulem.
N'ofesi

Ebe foto si, EPA
Ụlọọrụ na-enye aka n'ịchọtara ndị mmadụ ụlọ a kpọrọ Airbnb amachiela ime oriri na nkwari n'ụlọ ha maka mwakpo e mere n'otu ụlọ ha na California nke gburu mmadụ ise.
Onyeisi ụlọọrụ a bụ Brian Chesky depụtara nke a n'akara twitter ma kasie ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ obi.
Ngagharịiwe na Hong Kong

Ebe foto si, Reuters
Otu nwoke ji mma merụọ mmadụ anọ ahụ ma were arụ tapụ onye ọzọ ntị oge a na-eme ngagharịiwe na mba Hong Kong.
Ọ karịala ọnwa anọ ndị mmadụ malitere ngagharịiwe na mba Hong Kong n'ihi ọchịchị aka ike si n'aka ndị ọchịchị mba Chaịna.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Reuters
Otu egwuregwu bọọlụ Leicester City jị ọkpụ goolu abụọ asataghị otu nyụọ ndị Crystal Palace anya n'ehihie ụbọchị ụka n'asọmpi English Premier League.
Nwaafọ Igbo bu Wilfred Ndidi so n'egwu mgbe ha nwetara mmeri a.

Ebe foto si, Getty Images
Levante menyụrụ Barcelona anya n'asọmpi La Liga ụbọchị Satọdee site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie ha.
Agbanyeghi na Barcelona bu ụzọ nye ha goolu, Levante ji nkeji asaa nye Barcelonia goolu atọ ndị ahụ.
Nkeji
Ihe nkiri ga-amasị gị:
















