Cult clash: Ọgụ ndị otu nzuzo ataala isi ụmụokorobịa atọ n'Anambra

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii n'Anambra steeti ekwuola na ụmụokorobịa atọ a gbagburu n'Ogidi nakwa Ogbunike bụ maka ihe gbasara otu nzuzo.
Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti kwuru nke a mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ.
Ụkwụ tọrọ ndị mmadụ n'ala taa bụ Fraide mgbe ndị ekperima gbaara ụmụokorobịa abụọ tọgbọ n'ahịa Oye Ogidi .
Ndị nọ nso mgbe ya bụ ihe mere kwuru na aha ụmụokorobịa ndị ahụ e gburu bụ Chisom Umeadị, onye Anietiti Ogidi, nakwa Ebuka.
Mohammed gwara anyị na ya bụ ihe mere n'eziokwu.
O kwuru sị, "a na-enyo ụmụokorobịa ndị ahụ enyo na ha so n'otu nzuzo 'viking' mana anyị amatabeghi ndị gburu ha.
"Anyị na-agbazị mbọ ugbua ịchọpụta ndị kpara arụ a."
Mohammed kwuru na ndị ahụ gbagburu nwokorobia ọzọ aha ya bụkwa Ebuka n'Ogbunike.
Ọ gwara anyị na ụmụokorobịa ahụ akarịghị afọ iri abụọ na ise ruo afọ iri abụọ na asaa.

Ebe foto si, Facebook/Nigeria Police Force
Mgbe anyị jụrụ ya ihe ndị uweojii na-eme iji belata ihe gbasara otu nzuzo n'Anambra, Mohammed kwuru na ha na-anwa oke ha.
Ọ sịrị, "Anyị na-anwụchị ndị otu nzuzo kwa ụbọchị.
"N'izuụka gara aga, anyị nwụchịrị ndị ntorobịa ruru iri anọ na anọ bụ ndị a na-arụ aka iso n'otu nzuzo."
Haruna kwukwara na onyeisi ndị uweojii na Naijiria bụ Adamu Mohammed nakwa onyeisi ha n'Anambra steeti enyela iwu ka ha gbaa mbọ kwụsị ihe ọbụla nwere ike ibute nkwafu ọbara na mpaghara Naijiria niile.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:










