Nekede: Agha otu nzuzo ataala isi ụmụakwụkwọ anọ - Uweojii

Ebe foto si, Getty Images
Onụ na-ekwuchitere Mahadum 'Federal Polytechnic' Nekede dị n'Imo Steeti ekwuola na ọ bụghị ụmụakwụkwọ ha nwụrụ na nwakpo ndị a na-eche na ọ bụ otu nzuzo mere n'akụkụ Nekede.
Cheta na akụkọ si n'aka ndị uweojii kwuru na opekatampe mmadụ anọ anwụyụọla anya ebe ọtụtụ merụrụ ahụ,
n'ọgụ dapụtara n'etiti otu nzuzo abụọ n'ụlọ akwụkwọ 'Federal Polytechnic' Nekede dị n'Imo Steeti.
N'ihi ọgụ na ọgbaghara a, ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi ụlọakwụkwọ ahụ nọzi n'egwu na ihe ize ndụ ugbu a.
Otu nwata akwụkwọ bụ Frank hụrụ ka ihe si mee gwara BBC Igbo na nkpamkpa ọjọ a malitere n'izuụka gara aga n'etiti otu nzuzo abụọ bụ 'Aye' na 'Bagger'.Frank kwuru na o bidoro mgbe ahụtara ozu nwata akwụkwọ a, bụkwa onye na-edozi isi n'ihu ụlọ akwụkwọ ahụ.
Nke a kpatara ogbugbu e gburu nwata akwụkwọ ọzọ na-agụ ihe ọmụmụ 'Public Administration' n'ogbe ebe akpọrọ South Africa.N'okwu ya "Nke a mere ha jiri bido gbuwe mmadụ aghara aghara. Ka ọ dị ugbu a, eji m n'aka na ihe karịrị mmadụ anọ anwụọla, mana ejiri m anya m hụ ozu mmadụ anọ".
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na mmadụ anọ anwụọla.
O kwuru na ndị uweojii ejidela mmadụ iri ma nata ha egbe ruru ise dịka ha ka na-eme nyocha iji chọpụta otu nzuzo na-akpa arụ a.









