Emir of Kano: Nchutu Sanusi wụrụ m akpata oyi - Moghalu

Kingsley Moghalu na Sanusi

Ebe foto si, Kinsley Moghalu/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Kingsley Moghalu bụ onye ji aha pati UPP zọọ ọkwa onyeisiala etinyela ọnụ n'ọchụchụ Sanusi dịka Emir nke Kano.

N'ozi o wepụtara n'akara twitter, Moghalu sị na ọchụchụ Sanusi bụ ihe akpata oyi nye ya, ma bụrụkwa ihe mgbawa obi.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Cheta na Kingsley Moghalu na Sanusi rụkọrọ ọrụ n'ụlọakụ etiti mgbe Sanusi bụ onyeisi ha, ọ họpụtara Moghalu dịka otu n'ime ndị osote ya.

Nke a mere Moghalu ji akwanyere Sanusi ugwu dịka nna ya ukwu n'ihe banyere akụnaụba.

Sanusi kwadoro Moghalu mgbe ọ na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019.

Aminu Ado Bayero abụrụla Emir nke Kano ọhụrụ

Aminu Ado Bayero

Gọọmentị Kano Steeti ahọpụtala Aminu Ado Bayero Emir ka ọ bụrụ nke Kano ọhụrụ.

Odeakwụkwọ Steeti ahụ bụ Alhaji Usman Alhaji kwụpụtara nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

Tupu ugbua Aminu Ado bụ Emir nke Bichi nke gọvanọ Ganduje kewapụtara ọhụrụ.

Aminu Ado Bayero bụ nwa Emir Ado ga-abụzi Emir nke iri na ise ga-achị obieze Kano nke Fulani.

O jiela ọkwa dị iche iche n'ọchịchị Kano dịka 'Kano Trucks', Eze ndị 'Sacred Heart' nakwa 'Kano River'.

Ọ bụ nwa nwoke nke abụọ kachasị okenye n'ezinaụlọ Eze Ado Bayero nwụrụ anwụ.

Etu esi chụpụ Sanusi n'obi ọchịchị Kano

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Ndị ọrụ nchekwa na Kano achụpụla Eze Sanusi site n'obi ọchịchị dị na Kano n'ime awa ole na ole gọọmenti kwụsịrị ya ọrụ n'ike.

Kọmishịona mgbasaozi na Kano steeti bụ Muhammad Garba gwara BBC na onweghi ihe mere Emir Sanusi.

"A ga-akpọga ya n'ụlọ nwere nchekwa ebe ọ ga-ebi," Muhammad Garba kwuru.

Mana akụkọ kwuburu na a gbara anwụrụa anya mmiri n'obi ọchịchị.

BBC dere akụkọ na ndị ọrụ nchekwa gara ebe ahụ mgbe ụmụnwaanyị gbakọrọ mana ha malitere ịtụ ndị nchekwa okwute.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia

@cchukudebelu kwuru na ọ bụ ugbua ka Sanusi ga-abụzị onyeisiala Naịjịrịa.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@Abizarridanmusa kwuru na ihe a mere Sanusi nwereike ịbụ Ngọzi nye ụmụ Naịjirịa.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@Omojuwa na-ekwu na Sanusi agbanyeghị na ewepụla ya n'oche eze Kano, ọ ka dị ụmụ Naịjiria mkpa.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Kano emirate

Ebe foto si, Patrick van Katwijk

Nkọwa foto, Emir Muhammadu Sanusi rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa malite n'afọ 2009 rue 2014 tupu o were ọkwa Emir

Gọọmenti Kano ekwuola na ọ bụ ha wepuru Emir nke Kano bụ Muhammadu Sanusi n'ọkwa ọchịchị Emir ya.

N'ozi odeakwụkwọ steeti Kano bụ Alhaji Usman Alhaji wepụtara kọwara ihe mere ha ji, na ọ bụ ndịisi ọchịchị kwekọrịtara iwepu Sanusi n'ọkwa.

Ha sị na Sanusi anaghị akwanyere ọchịchị gọvanọ Kano steeti ugwu ruru ya. Na ọ naghị aza oku gọọmenti Kano kpọrọ ya, nke nwereike imebi ọchịchị Kano.

Mana onye ọnụ na-eru n'okwu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Kabiru Safi Sufi sị gwara BBC na ọ bụ maka etu Sanusi ji akatọ ọchịchị gọvanọ Kano bụ Abdullahi Umar Ganduje.

Onye bụ Eze Muhammad Sanusi nke abụọ?

Emir Kano Muhammadu Sanusi nke abụọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Emir ndị Kano Muhammadu Sanusi nke abụọ
  • A mụrụ ya n'obieze ndị Fulani, o wee bụrụ onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa n'afọ 2009.
  • Gọọmenti Onyeisiala Goodluck Jonathan chuturu ya n'afọ 2014 mgbe ọ sị na ijeri dọla 20 bụ ego mmanụ agbịdị na-efu efu.
  • E mere Emir nke Kano nke iri na anọ n'afọ 2014 ma nna nna ya bụ Emir nke ugboro iri na otu.
  • A chuturu ya n'ọkwa a n'ụbọchị 9 Maachị, afọ 2020.

ASUU agbaala abụbụọrụ izuụka abụọ

Mahadum Naíjiría.

Otu jikọtara ndị nkuzi mahadum na Naịjirịa bụ ASUU n'ịchafụ amalitela abụbụọrụ izuụka abụọ taa.

Onyeisi ha bụ Biodun Ogunyemi gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ụbọchị Mọnde dịka ha mechara nzukọ ndịisi otu ahụ n'Enugwu

Ọ sị na nke a bụ iji dọọ gọọmentị aka na ntị ka ha leba anya ma mezuo nkwekọrịta ha nwere n'afọ 2009 ruo 2019'

Abụbụọrụ a ga-anọ izuụka abụọ malite n'ụbọchị Mọnde 9 Febụwarị 2020.

Ihe ise ọhụru Ụkọchukwu David Oydepo kwuru maka ọchịchị Buhari

David Oyedepo

Ebe foto si, @davidoyedepomin

David Oyedepo bụ ụkọchukwu Winners Chapel esuwala akụ oyibo nsugbe maka ọchịchị nọ ugbua na Naịjirịa.

O kwuru na ihe kacha njọ merela Naịjirịa bụ ọchịchị nọ ugbua.

Oyedepo kwuru okwu a n'ọgbakọ ụka sọnde nke Maachi asatọ nke afọ 2020 n'ụlọ ụka ya.

Lekwa ihe anọ ndị ọzọ o kwuru

  • Ọchịchị nọ ugbua a enweghị ntuziaka tọrọ atọ
  • A gụọla ụbọchị ha nwere ịchị ọnụ
  • Ha na-eme iwu mkpagbu
  • Ọchịchị nọ ugbua dịka abụmọnụ nye ndị Naịjirịa
  • A bụ m nwafọ Naịjirịa , ma ihe, abụghị m ụmaaka n'ihe gbasara Naịjịrịa.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia maka okwu ya

@the_davidatta kwuru ka Oyedepo kwụsị ikwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị ma gbado ụkwụ n'igbasa oziọma.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Skip X post, 6

End of X post, 6

@Iamroyaltea1 kwuru na o nweghị ihe dị njọ na mmadụ kwuru uche ya gbasara okwu na-emetụta ya.

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 7

NCDC

Ebe foto si, @NCDCgov

Minista na-ahụ maka Ahụike bụ Osagie Emmanuel Ehanire ekwuola na onye ọzọ ebutela coronavirus na Naịjirịa.

Dịka ngalaba na-ahụ maka ọrịa ịgbasa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) si na onye so n'ime ndị zutere onye bụ nje bata Naịjirịa na steeti Ogun.

Skip X post, 8
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 8

NCDC na-akọwa na onye nọbụ n'ebe akpọsara ndị eche na ha nwere nje a.

Ha sị na ndi niile zutere nwoke ahụ bubatara nje Naịjirịa ga-anọ ebe ahụ akpọsara ha, dịka a na-eme nyocha ndi nke emebeghi.

Coronavirus na mba Afrịka ndị ọzọ

Ndị ọrụ ahụike na mba Ijipt

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị ọrụ ahụike na mba Ijipt

Otu nwoke onye Germany abụrụla onye mbụ lara mmụọ n'ihi ọrịa coronavirus na mpaghara Afrịka.

Nwoke a gbara afọ iri isi nwụrụ na mba Ijipt n'ụbọchị Monde a.

Ndị ọrụ ahụike mba Ijipt kwuru na nwoke ahụ ekweghi ka edopu ya iche ka ọ ghara ibufe ndị ọzọ ya bụ ọrịa.

O ruola mmadụ 48 bu ọrịa coronavirus na Ijipt, nke a gụnyere mmadụ 45 na-eme njem nlere anya n'ime ụgbọ mmiri nke batara mba ahụ n'ụbọchị Satọde.

Ọnụọgụgụ ndị nwere ọrịa coronavirus na Afrịca

  • Ijipt - 48
  • Ọljirịa - 17
  • Senegal - 4
  • Saụt Afrịka - 3
  • Morocco - 2
  • Cameroon - 2
  • Naịjirịa - 2
  • Tunisia - 1
  • Togo - 1

Na mba Amerịka

Skip X post, 9
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 9

Ndị ọchịchị steeti Washington DC nke mba Amerịka arịọla ndị ụka a kpọrọ Christ Church ka ha kwụsị mmekọrịta ha na ndị mmadụ ruo abalị iri na anọ iji gbochie mgbasa ọrịa coronavirus.

Nke a na-abịa dịka achọpụtara na ụkọchukwu ụlọụka ahụ bụ onye mbụ butere ya bụ ọrịa na steeti ahụ.

Akụkọ kwuru na ụkọchukwu ahụ nyere ọtụtụ mmadụ oririnsọ ma kwekwa ha n'aka n'izuụka gara aga tupu e mechaa chọpụta na o nwere ọrịa coronavirus.

Boko Haram awakpola ọnọdụ ndị agha na mba Niger

Boko Haram fighters

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ

Ndị otu ọlụọ ọlaa akpọrọ Boko Haram awakporo ọnọdụ ndị agha na mba Nije ụbọchị Satọde.

Ndị agha meruru ahụ maka ya bụ mwakpọ na-anata ọgwụgwụ n'ụlọọgwụ dị na Diffa dịka ndị ọrụ ntaakụkọ AFP kwuru.

Ya bụ akụkọ kwuru na ndị ajọ otu bụ ọtutụ ụgbọlal ji ngwaagha dị egwu were bata ọnọdụ ndị agha nke Chetima Wango.

O nweghị ndị nwụrụ na ya bụ mwakpo.

Mmanụ agbidi adaala

ite mmanụ agbịdị

Ebe foto si, Getty Images

Ọnụ ahịa mmanụ agbidi ejirila pasent iri atọ maa afọ n'ala taa bụ Monde dịka Saụdị Arabịa na-akụtụ ọnụ ahịa mmanụ ma na-ebuputakwa mmanụ ka na-anwụ anwụ.

Nke a atọghị ọchị maka na ndị ọkachamara n'ahịa mmanụ na-atụegwu na ọ ka nwekwere ike ịdakwu.

Coronavirus na amụbanwanye n'Ịtali

Ndị ọrụ ahụike bu igbe ka ha si ụlọọgwụ Jinyintan ebe a na-elekọta ndị a chọtara ọrịa coronavirus, apụta

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ihe ruru mmadụ iri na ise bụ ndị ọrụ ahụike ebutela ọrịa n'obodo Wuhan

N'ofesi, ọnụọgụ ndị bụ Coronavirus na Ịtalị ewerela pasent iri abụọ na ise ria elu.

Nke a na-eme dịka mba ahụ gbochiri ọpụpụ na mbata obodo Lombardy nakwa ebe ndị ọzọ ya bụ ọrịa na-agbasa.

Leicester City na Aston Villa

Ndidi Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndidi Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi

Ụmụigbo Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi ga-eso n'egwu oge otu bọọlụ ha bụ Leicester City ga-ezute Aston Villa na abalị Monde.

Leicester na-agbalị ịnọsị ike dịka ndị nke atọ na tebulu English Premier League.

Real Madrid na Real Betis

Real Madridi na Real Betis

Ebe foto si, Getty Images

N'ewguregwu, Real Betis ewerela ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Real Madrid n'asọmpị La Liga agbara na Spain Ụnyahụ.

Mmeri a mere ka Real madrid bụbu ndị mbụ n'okpokoro ligi ha daa azụ.

Chetkwa na Coronavirus ka nọkwa, gaa na BBC Igbo mata ka ị ga-esi chekwaa onwe gị.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị