Sanusi Lamido Sanusi: Ikike ndị Eze Igbo eruru nke ndị ogbo ha?

Ụmụ Naijirịa tetara ụra ụbọchị Tọzde, Mee 9, were nụ akụkọ na ụlọomeiwu Kano steeti emeela iwu ọhụrụ nke kewapụtara alaeze anọ n'ime otu dịbu na steeti ahụ nke Lamido Sanusi Lamido bụ isi ya.
Ndị ma ihe ekwe kụrụ kwuru na ọ bụ gọvanọ steeti ahụ bụ Abdullahi Ganduje, bụ onye na-eti egwu ahụ ndị ụlọomeiwu na-agba dịka ha kwuru na ọ chọrọ ịkwachalata Sanusi nku.
Mana ọ bụghị naanị na Kano ka ụdịrị ihe a na-eme.

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ gara aga, Gọvanọ Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi, mere mmadụ iri abụọ na otu eze n'Ibadan iji kwalata eze Ibadan bụ 'Olubadan' nku.
Kesaa-kposa chie eze n'Ugwu-Awusa na ala Yoroba, o puru mpi n'ala Igbo.
Dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara ọdịnala nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu siri kọwaa, ikeri obodo nke a kpọrọ "autonomous communities" na Bekee n'alaigbo so n'ihe mere na ndị eze na-achị n'Ọwụwa-Anyanwụ enweghị agba ka ogbo ha ndị ala ọzọ.
Ezenka Udochukwu Agbarakwe gwara BBC Igbo na ihe mere na Kano nke bụkwa ihe mere e jiri nwee "autonomous communities" na mpaghara ụfọdụ n'Alaigbo, bụ "ihe ndị na-ebutu ugwu eze."
"Ọ bụghị ezigbo ihe maka na gidigidi bụ ugwu eze. Ọ bụ ọnụọgụgụ ndị onye eze na-achị nakwa ihe ha na-eme bụ ugwu eze."

Ebe foto si, Nnaemeka U. Trump
"Ọ bụ ihe mere na eze ndị Igbo enweghị nsọpụrụ dịka Ooni nke Ife, Emir nke Kano na Shehu nke Borno."
Ọ rụtụrụ aka na "n'Imo steeti, e nwere "autonomous communities" dị narị anọ. Gọvanọ Rochas nwere ọtụtụ "autonomous communities" a o kewapụtara n'oge ọchịchị ya."
Larry Oguego rụrụ aka na ọ bụ n' Imo, Abịa na Enugwu steeti ka ndị ọchịchị kachasị kesasịa obodo ma nye ha eze nke ha.
O kwuru na nke a bụ iji tinye ha n'akpa, "ka ha nwee ike were ndị ahụ were rụọ ọrụ n'oge ndọrọndọrọ ọchịchị."

Ebe foto si, Nnaemeka U. Trump
Oguego katọkwara atụmatụ ahụ sị, "e nweghị uru dị ya makana ụdịrị ndị a na-etinye abụghị ndị kwesịrị ịbụ igwe."
"Ọ na-ebute nkewa. Gọọmentị na-emefukwa ego ịkwụ ha ụgwọ ọnwa nakwa ịzụrụ ha ụgbọala."
Ọ gara n'ihu kwuo na o mere ka "Igwe karịa ndị ha na-achị."
"O kwesịrị na Igwe ga-enwe ugwu mana ugbua igwe bụ ịtọ kọbọ."
Mana Ifeanyị Onah kwuru na ikerisi obodo ma nye ha igwe na-ebute mmepe obodo.
"Ọ na-eme ka ọchịchị rue ndị a na-achị nso."








