Emir Sanusi enyela iwu ka a nwụchie nne na nna ndị a tọrọ ụmụ ha

Ebe foto si, Getty Images
Eze ọdịnaala Kano bụ Emir Muhammadu Sanusi nke abụọ akatọọla ntọrị a tọọro ụmụaka na Kano ma kpọrọ ha gawa Anambara steeti.
Emir Sanusi kwuru okwu a n'emume mgbasaozi otu a kpọrọ League for Societal Protection Against Drug Abuse (LESPADA) haziri na Kano.
Ọ sị na ya na Obi nke Ọnịcha bụ Igwe Achebe ekwuola okwu maka ntọrị a ma kwukwa na ya na-eso etu o si aga kemgbe akụkọ banyere ntọrị a pụtara ihe.
Kemgbe achọtara ụmụaka itoolu ahụ n'Ọnịcha, ụfọdụ mmadụ n'ugwu Naịjirịa na-akatọ ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, bụ ebe ndị ntọrị a kpọgara ha.
Emir Sanusi gbarụrụ ihu maka ụdịrị atụmatụ a ma sị na agwa ọjọọ enweghị agbụrụ.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na nne na nna nwere ebe ha si rie mperi na ntọrị ụmụaka ha.
"Ọ bụrụ na ị na-eche na ọ bụghị n'aka nne na nna ka o si, gaa Ọnịcha gaa nwaa ịtọrị nwata ka ị chọpụta na ị gaghị emenwu.
"Anyị kwesịrị ịgbanwe etụ anyị si eche uche ma kwụsị ịta ndị ọzọ ụta maka nsogbu dị na be anyị."
Sanusi sị na ha anaghị ekwu na ndị ntọrị emeghị ihe ọjọọ, kama na ihe ya na-ekwu bụ na nne na nna kwesịrị ịgba mbọ tinye anya n'ebe ụmụ ha nọ.
Ọkwu a Emir Sanusi kwuru mere ka ọtụtụ mmadụ gbarụọ ihu na Twitter.
Ndị sị na okwu ya adabaghị:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Nakwa ndị nke sị na ihe o kwuru dabara:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

End of X post, 4
Ndị uweojii nwụchiri mmadu asatọ ha si aka ha dị na ntọrị ụmụaka itoolu ahụ dị afọ abụọ ruo iri.
Ha enyefela ụmụaka ahụ ndị nwee ha.
Onyesisi ndị uweojii na Kano steeti bụ Ahmed Iliyasu sị na atọrọ ụfọdụ n'ime ha n'afọ 2014.
Ihe nkiri ga-amasị gị: