Kidnapping: ụzọ asatọ ị ga-eji agbalahụ ndị ntọ

Ebe foto si, AFP
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa steeti bụ Godfrey Ogbonna kọwara ụzọ anọ a ga-eji agbalahụ ndị ntọ ọkachasị ugbua akụkọ ndị ntọ juru ebe niile.
Ihe ndị a ka okwuru:
- Ọ bụrụ na ị na-anya ụgbọala lewe anya na nnyo gị mara ka onwere onye na-eso gị na azụ.
Ọnwee onye ọ dị gị ka ọ na-eso gị, mee ngwa ngwa gbaba n'ebe ndị uweojii maọbụ ndị agha nọ gaa kpesara ha.
- Ị ruo n'ụlọ gị, gbaa mbọ legharịa anya tupu ị meghe geti ụnụ. Ọ nwee onye ọ dị gị ka ọ nọ nsọ ị ghọtachaghị, gafere be gị chọwa uzọ ebe ndị uweojii nọ.
- Onye nwere ụmụaka dụọ ha ọdụ ka ha ghara ị meghe ụzọ utupu ha amata onye nọ n'ụzọ.
- Onye ga-ebe mmeme, egosila na iji ego site na ịbọ ọtụtụ ego.
- Agwala onye ịtụkwasịghị obi ebe ị na-aga.
- Duo ụmụ gị aka na ntị ka ha ghara iso nso onye ha amaghị
- Gbaa mbọ hụ na gị na mmadụ so, ọkachasị mgbe ị na-aga n'ime ọhịa maọbụ n'ụbi.








