Under 17 Championship: Golden Eaglets azọọla Uganda ụkwụ n'isi wufe Semi final
Akụkọ kachasị tata
Golden Eaglets abanyela agba osote ngwụcha

Ebe foto si, NFF
Agbanyeghị tigbuo zọgbuo ndị a, ndị otu egwu bọọlụ Super Eaglets etinyela anyị ọchị n'ihu.
Ha ejiriala otu ọkpụ otu ọkpụ gbaara ogbo ha nke Uganda ụgbọ nwamkpị n'asọmpị akpọrọ under 17 nations cup
Ha wuferela na agba bụ osote nke ngwụcha n'asọmpi ahụ.
Otu ezi na ụlọ nwụrụ n'Ebonyi

Ebe foto si, Loveth Odah
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ebonyi steeti bụ Loveth Odah ekwuola na ọgụ na ada n'etiti Ikwo na Izza ataala isi mmadụ asatọ ọzọ.
Mmadụ ise n'ime ha sị otu ezinaụlọ bụ ndị gara ịnọnyere nwa ha mere emume ịbanye mahadum.
Maka ndị ntọ na Kaduna

Ebe foto si, Getty Images
Na Kaduna ndị ntọ egbuoala nwanyị bịara njem nleta na otu onye ọzọ ma tọrọ mmadụ atọ n'Okpuru ọchịchị Kajuru n'ụbọchị Satọde.
Nke a mere ka mmadụ iri na otu nwụrụ n'aka ndị amakekwụ na steeti Benue n'isi ụtụtụ ụnyahụ
Ogbunigwe na Sri Lanka

N'ofesi, Mazị tigbuo zogbu akarịa n'ụwa ugbua.
Nke na-eme ugbua bụ na-agbaala ogbunigwe isii na ụlọụka nakwa ụlọoriri na nkwari na Sir Lanka ebe ndị mmadụ na-agba Easter.
Mmadụ iri abụọ awụọla ebe otu narị mmadụ na ụma iri isii merụrụ ahụ.














