AFCON U20: Otu bọọlụ mba Naịjirịa emeriela nke Nijey

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa taa

Otu bọọlụ Naịjirịa nke ndị erughi afọ 20

Ebe foto si, @thenff/Twitter

Otu bọọlụ Naịjirịa nke ndị erughị afọ 20 etozuola ịga asọmpị Iko Mba Afrịka dịka ha ji otu ọkpụ goolu merie mba Nijiey mgbe ha zutere onwe ha taa.

Na ndọrọndọrọ,

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec adọọtịala ohere ha nyere ndị mmadụ ịji nata PVC ha site n'ụbọchị Fraide ruo ụbọchị Monde

Ọ gụnyere ụbọchị satọde nakwa ụbọchị ụka site n'elekere itoolu nke ụtụtụ rue elekere isii nke mgbede kwa ụbọchị.

Wole Soyinka

Ebe otu Citizen Forum, nke onye na-ede akwụkwọ ama ama bụ Wole Soyinka kpokọbara adọnyerela Kingsley Moghalu nke otu YPP ukwu maka ọkwa onyeisiala na 2019.

Joe Igbokwe nke APC na Ugochukwu Ikeakor nke PDP akpọọla Ndigbo oku ka ha pụta tụọ vootu ụbọchị ntuliaka iji kwado mwulite Alaigbo.

Ha kporo okwu a na mkparịtaụka ha na BBC Igbo nwere na Facebook n'ubọchị Fraide.

N'egwurewgu,

Ụwa niile, ọ kachasị ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị pụtara ịgosi obi ntiwa ha dịka achọtara ozu Emiliano Sala bụ onye ọgba bọọlụ mba Ajentina nọ n'ime ụgboelu dara mmiri na mgbede tọọzde.

Akụkọ BBC Igbo n'ime otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

N'ụtụtụ,

Ndị na-akwado Buhari na Jalingo

Ebe foto si, @GarShehu

A zọgburu ihe ruru mmadụ abụọ ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ọgbọ egwuregwu Jolly Nyame n'ọsọ achụmnta vootu APC mere na Jalingo Taraba Steeti.

Onyeisiala Buhari kwuru na ọ na-ewute ya nke ukwuu ma ndị hụrụ ya n'anya tufuo ndụ ha n'ihi ịkwado ya.

Ndị ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ

Obi ụtọ juru ụmụakwụkwọ mahadum afọ dịka otu jikọtara ndị nkuzi ha bụ ASUU akwụsịla abụbọ ọrụ ha bidoro kemgbe ọnwa atọ.

Nkwụsị a bịara na ngwụcha nzukọ ndị isi ha na minista na-ahu maka ọrụ bụ Chris Ngige nwere n'Abuja.

Ebe onyeisi ndị ASUU bụ Abiodun Ogunyemi sị ka ndị nkuzi bido ọrụ ozugbo.

N'ofesi,

Jeff Bezos

Ebe foto si, Getty Images

Onye kachasị enwe ego n'ụwa bụ Jeff Bezos kwuru na ụlo ntaakụkọ National Enquirer yiri ya egwu na ha ga-agba ihe o jiri bụrụ nwoke n'anwụ ma ọ gwaghị ọha okwu masiri ha.

Ọ kwuru na Enquirer sị ya kwuo na ọbụghị ndọrọndọrọ mere ha ji ebu akụkọ gbasara ya n'akwụkwọ mgbasa ọzi ha.

N'egwuregwu,

Ekwuola na ozu ahuru bụ nke Emiliano Sala

Ebe foto si, PA

Achọpụtala na ozu ahụ ahụrụ n'ime ụgbọelu ahụ kpọkasiri akpọkasị bụ nke onye otu egwuregwu Cardiff City bụ Emiliano Sala.

Cheta na Sala mere njem na-aga Cardiff mgbe ụgbọelu ọ nọ na ya nke onye na-akwọ ya bụ David Ibbotson dabara na mmiri.

Gee nkeji a ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa:

Aha onyonyo, Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha