Israel Adesanya vs Yoel Romero: Odogwu nwaafọ Naịjirịa e turula ugo

Ebe foto si, Getty Images
Israel Adesanya eturula ugo na asọmpi UFC n'ụtụtụ Sọnde oge o zutere Yoel Romero.
Odogwu abụo a zutere n'ogige T-Mobile Arena dị na Las Vegas na mba Amerịka.
Romero mara Adesanya aka ịnapụ ya mgbanukwu "Middle Weight Tittle" ya.
Nke a bụ mbụ mmadụ na-azọsa Adesanya mgbande ukwu a o ritere n'afọ 2019.
Adesanya yi uwe ndị Naịjirịa bata ogige egwuregwu ebe a ga-apịa ya bụ ọkpọ.

Ebe foto si, Getty Images
Nwa afọ Naịjirịa a alụọla ọgụ ugboro 18 ma merichaa ha niile.
N'aka nke ọzọ, Romero alụọla ọgụ ugboro 13, merie iri, e merie ya na atọ.

Ebe foto si, Getty Images
Adesanya, onye e ji 'the lsat stylebender mara' bụ na Legọs ka a mụrụ ya tupu nne na nna ya agaa mba Ghana, mechaa gaa mba New Zealand.
Ọ bụghị naanị ya bụ nwa afọ Naịjirịa na-akụ ọkpọ na UFC, onye nke ọzọ bụ Kamaru Usman, onye e ji 'the Nigerian nightmare' mara.
Adesanya na Usman bụcha ọkaibe n'ogogo dị icheiche ha abụọ nọ n'ime ya.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya na Adesanya ga-eturu ugo na ọgụ nke taa.
@DavicSamuel kwuru na ya kwunyere Adesanya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@SunkanmiShams kwukwara na ya na-ele anya ka Adesanya merie.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
WHO etoola Naịjirịa
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Onyeisi otu ahụike mba ụwa bụ Tedros Ghebreyesus etoola gọọmentị Naịjirịa maka mbọ ha na-agba iji buso ọrịa coronavirus agha.
O kwuru na ọ magburu onwe ya etu ndịọrụ ahụike Naịjirịa si ekekọrịta ihe ha mụtara site n'aka onye mbụ bu ọrịa coronavirus bata n'obodo ahụ.
Mana onyeisi nglaba mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na gọọmentị na-agbasị mbọ ike ịhụ na ọrịa ọjọọ a agbasaghị na Naịjirịa.
A ga-enyere ndịagha aka iji gbochie isi mgbaka

Ebe foto si, Getty Images
Ndị isi ndịagha Naịjirịa kwuru na ha ehibela ngalaba ga na-enyere ndịagha aka ileta ahụike ha anya, ọkachasị n'ihe gbasara ọrịa isi mgbaka.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ akụkọ pụtara gbasara ndịagha igbu onwe ha maọbụ iji egbe gbagbuo ndị nọ ha okirikiri.
N'ụbọchị 26 nke ọnwa February, otu onye agha ji ọkwa 'Corporal' ji egbe gbagbuo ndị otu ya mmadụ anọ, mechaa gbagbuo onwe ya.
Nke a mere n'obodo Malam ftori dị na Borno Steeti.
N'abalị abụọ nke ọnwa Janụwarị, akụkọ kọkwara etu otu onyeagha si were mma sụkasịa nwunye ya na nwa ya nwoke na be ha n'Ede, Osun steeti.
Onyeagha ahụ jikwa mma magbuo onye agbatobi ha, gbukwaa onyeagha ọzọ chọrọ ịnapụ ya mma ahụ.
Akụkọ ọjọ ndị a mere ka e hibe ngalaba ga na-eleru ndị agha anya gbasara isi mgbaka.
Onyeisi mgbasa ozi ndị aha bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ha ehibela 'Psychological Counselling Unit' n'obodo dị icheiche maka ya bụ ihe.
Ụlọ dara na Chaịna

Ebe foto si, EPA
Ihe ruru mmadụ iri asaa tọrọ n'ime ụlọ ebe e dopuru ndị a na-enyo enyo maka ọrịa coronavirus iche na mba Chaịna n'abalị Satọdee.
A zọpụtara mmadụ iri anọ n'asaa n'ime ha, ebe ndịọrụ gbatagbata ka na-agbalị ịzọpụta ndị ọzọ.
Ndị ọrụ mechara kwuo na ha ahụla ozu mmadụ isii n'ime ụlọ ahụ, ebe ihe ruru mmadụ iri 28 ka ha ka na-achọ achọ.









