Kedụ etu ndịagha Naịjirịa abụọ si nwụọ?

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndịagha Naịjirịa abụọ nwụrụ n'ehihie ụbọchị Wenezday n'obodo Gwoza na Borno steeti.
Ụlọ ntaakụkọ Premium Times na-akọwa na ọ bụ otu n'ime ndịagha abụọ ahụ gburu onwe ya ma gbukwa onyeagha ibe ya.
Ha gakwara ihu kpọpụta aha onyeagha ahụ ka Adegor Okpako na onye ọzọ nwụrụ dịka naanị "Saka".
Mana ndịagha Naịjirịa esila n'akara Twitter ha kwuo na ọ bụ ihe ọdachi riri ndụ mmadụ abụọ ahụ.
Ha kwukwara na ọ bụ mgbe a na-akuziri ha ihe ka mgbọ amaghị ụma gbapụ nke bụ 'accidental discharge' gburu ndị ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị ụlọọrụ ntaakụkọ nke Premium Times kwuru na mmadụ anọ ọzọ merụrụ ahụ mgbe Okpako malitere ịwụ mgbọ ebe niile.
Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha ga-eme okwu a nyocha ziri ezi iji ghọta ihe butere ya bụ mwakpo.
Akụkọ ga-amasị gị
































