Kedụ etu ndịagha Naịjirịa abụọ si nwụọ?

Onye agha nọ na nzuzo

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndịagha Naịjirịa abụọ nwụrụ n'ehihie ụbọchị Wenezday n'obodo Gwoza na Borno steeti.

Ụlọ ntaakụkọ Premium Times na-akọwa na ọ bụ otu n'ime ndịagha abụọ ahụ gburu onwe ya ma gbukwa onyeagha ibe ya.

Aha onyonyo, Mkparitaụka Aisha Wakil na BBC Igbo

Ha gakwara ihu kpọpụta aha onyeagha ahụ ka Adegor Okpako na onye ọzọ nwụrụ dịka naanị "Saka".

Mana ndịagha Naịjirịa esila n'akara Twitter ha kwuo na ọ bụ ihe ọdachi riri ndụ mmadụ abụọ ahụ.

Ha kwukwara na ọ bụ mgbe a na-akuziri ha ihe ka mgbọ amaghị ụma gbapụ nke bụ 'accidental discharge' gburu ndị ahụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ndị ụlọọrụ ntaakụkọ nke Premium Times kwuru na mmadụ anọ ọzọ merụrụ ahụ mgbe Okpako malitere ịwụ mgbọ ebe niile.

Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha ga-eme okwu a nyocha ziri ezi iji ghọta ihe butere ya bụ mwakpo.

Akụkọ ga-amasị gị