Nigerian Army: Ha bịara na-amaja ndị Afaraukwu Ibeku - Emmanuel Kanu

Ebe foto si, Getty Images
Nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel Kanu sị na ọ bụ eziokwu na ndịagha Naịjiria batara n'obodo ha bụ Afaraukwu Ibeku dị n'Umuahia Abia Steeti.
Ọ gwara BBC Igbo nke a mgbe a kpọrọ n'ekwentị maka kepupu a nụrụ banyere ya.
Ọ sị na ha bu ngwaagha dị iche iche bata n'obodo ha n'ehihie ụbọchị ụka ma bido ịmaja ndị mmadụ.
Kanu sị na nke a butere oke egwu n'obodo dịka onweghi onye mara ihe ha bịara ime.
Ọ sị na ọ bụ ụdị ihe ha mere n'afọ 2017 butere ọnwụ nne na nna ya bụ ndị a na-akwado ili.
BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Musa Sagir n'ekwentị ịnụta n'ọnụ nke ha mana ọ zaghị.
Daniel Amokachi ga-anọchite anya Naịjirịa n'okwu ịgba bọọlụ

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari ahọpụtala Daniel Amokachi dịka onye ga-anọchiteanya Naịjirịa n'ihe banyere egwuregwu bọọlụ.
Ọ ga-enyere mịnịstrị na-ahụ maka egwuregwu na ndị ntoroọbịa aka ịnyopụta ndị na-eme nke ọma n'egwuregwu bọọlụ.
Cheta na Amokachi so n'ime ndị Super Eagles mabutere iko mba Afrịka n'afọ 1994 nakwa ọlaedo n'Atlanta Olympics n'afọ 1996.
Nkeji
Ihe nkiri
Naịjirịa ewpụtala okpụrụ visa ọhụrụ

Ebe foto si, Twitter/Bashir Ahmad
Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ndị ya na-arụ ọrụ ụkpụrụ 'visa' Naịjiria.
Dịka ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Bashir Ahmad si dee na Twitter, ya na ndị na-arụrụ ya ọrụ gụnyere Lai Mohammed bụ minista na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjiria, nọ n'ime nzụkọ ime ụlọ ebe ọ na-egosiputa atụmatụ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Tolu Ogunlesi bụkwa ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Buhari kọwara etu atụmatụ a si metụta ma ndị chọrọ ịbịa mee ihe dị iche iche na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

End of X post, 4
'World Cancer Day'
Taa bụ ụbọchị anọ nke ọnwa Febrụwarị, bụ ụbọchị mbaụwa wepụtara kwa afọ maka ọrịa akpụ a kpọrọ Cancer na Bekee.
Ị nyochaala onwe gị? Kwadokwa ndị na-arịa ya nakwa ndị si n'ọrịa a gbakee.
Lee akụkọ onye meriri ọrịa a:
Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na Chaịna nakwa mba ndị ọzọ, otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na mba ahụ emepeela mpio etu ọnọdụ ha ebe ahụ si kwụrụ.
Nwa ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara BBC Igbo na ọnọdụ ha na Chaịna, bụ ebe ọ na-agụ mahadum, adịghị mma ma ncha, na ha "ahụghị gọọmentị anya nke ha ji anụ ọnụ okwu ha".
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a:
arap Moi anwụọla

Ebe foto si, Getty Images
Daniel arap Moi bụbu onyeisiala mba Kenya anwụọla n'afọ iri itoolu na ise.
Arap Moi rituru n'ọkwa n'afọ 2002 ka ọ chịchara afọ iri abụọ na anọ, nwụrụ n'isi ụtụtụ taa.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Trabzonspor akatọọla ịkpa oke agbụrụ ndị mmadụ kpasoro John Mikel Obi bụbu onye ndu Super Eagles, na soshal midia ka ha zutechara ma merie Fenerbahce n'ụbọchị Satọde.
Trabzonspor kwuru na ha emeela mkpesa maka okwu a n'ụlọikpe.
A ga-emegharị ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Malawi

Ebe foto si, AFP
Ụlọikpe dị na mba Malawi enyela iwu ka e megharịa ntuliaka, dịka ọ kagburu mpụtara kpọghachịtara onyeisiala Peter Mutharika n'ọkwa n'ụbọchị 21 nke ọnwa Mee afọ 2019.
Ọkaikpe nyere iwu ahụ ka a chọpụtara na mpụtara ntuliaka ahụ agaghị n'anya ya etu o kwesịrị, ma kwuo ka e mee ntuliaka ọzọ n'ime ụbọchị 151.
Ụlọikpe ahụ kwukwara na Onyeisiala Mutharika ga-anọkwa n'oche ọchịchị ya ruo mgbe e mere ntuliaka ọzọ.
Nke a emeela ya ntuliaka mbụ a ga-agbagha n'ụlọikpe kemgbe Malawi nwetara nwereonwe ha n'afọ 1964.
Eduola iyi ọrụ n'Imo steeti
Eduola Cosmas Iwu bụbu odeakwụkwọ gọọmentị Imo steeti n'oge Ikedi Ohakim n'iyi ọrụ n'otu ọkwa ahụ n'okpuru Hope Uzodinma.
E dukwara Cyprian Akaolisa iyi ọrụ dịka Ọkaiwu kachasị na kọmishọna na-ahụ maka ikpe ziri ezi nke steeti ahụ, ma dukwaa Nnamdi Anyaehie iyi ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ nke steeti ahụ.
'Ịza nwunye ka mma'
A na-abọkasị Adamu Garba zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa ka ọkụkọ n'elu soshal midia, dịka o kwuru na nwaanyị ịza 'nwunye' ka mkpa karịa ịchị ụlọakụ CBN.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Ndị mmadụ akpọkachaala ya ntu maka okwu ya:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6

End of X post, 7

End of X post, 8
Cheta na Garba bụkwa onye kwuru na ọ bụ ndụ ndị Amerịka ndị Naịjirịa na-ebi ka e kwesịrị ịta ụta maka etu ụfọdụ ndị Naịjirịa si echefu onwe ha na ebe ha si.
Ọnọdụ Neymar
Neymar agaghị eso ndị PSG mgbe ha ga-ezute Nantes taa dịka e kwuputara na ọ merụrụ ahụ n'egwuregwu nke satọde.

Ebe foto si, Getty Images
Neymar dị afọ 28 na onwe ya, kpọrọ pati ụbọchị ụka iji mee emume ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:
Ihe nkiri a ga-amasị gị: