Football Freestyle: 'Eji m iko bọọlụ enyere onwe m aka n'ụlọakwụkwọ'
Nwada Blessing Faith Onyemaucheya bụ onye na-agba bọọlụ kọwara etu o si malite iji iko bọọlụ enyere onwe ya aka n'ụlọakwụkwọ.
Ọ sị na ọ malitere inwe mmasị n'ịgba bọọlụ mgbe ọ dị na nwata, nna ya na-akpọ ya a ga-ekiri bọọlụ.
Dịka o tolitere, ọ malitere gbawa bọọlụ mana o nwebeghi ohere ịgba ya ruo ebe ọ ga-enye ya ego.
Nke a mere o jiri malite iko bọọlụ iji mee ndị mmadụ obiụtọ ma na-enwete ego na ya.
Blessing agakwala ọtụtụ asọmpi iko bọọlụ ma rite nturuugo dị iche iche.
Kirie ihe o kwuru n'uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter na Ikechukwu Kalu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

