Brexit: Ihe asaa ga-agbanwe dịka Briten apụọla n'otu EU

Ebe foto si, Getty Images
Ndị n'ọchị ndị n'akwa dịka United Kingdom esila n'ọgbakọ European Union pụọ n'ikpeazụ mgbe ha nọchara afọ iri anọ na asaa n'ime ya.
O were United Kingdom ihe karịrị afọ atọ iji mee ntuliaka maka ọpụpụ ha.
Kemgbe afọ atọ a, Praịm Mịnịsta abụọ agbaala arụkwaghịm.
Mana ajụjụ dị ndị mmadụ n'ọnụ karịsịa ndị Naịjirịa bụ kedụzie ihe ga-agbanwe ugbua ha pụrụ?
Onye nke atọ bụ Boris Johnson bụzi onye ga-edu Briten pụọ na EU bụ nke a kpọrọ 'Brexit' na Bekee.
Ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị Fraịde, ụbọchị 31 nke ọnwa Janụwarị afọ 2020, Briten agaghịzi abụ otu n'ime mba ndị nọ n' EU.
Lee ihe asaa gbara ọkpụrụkpụ ga-agbanwe ma nke a mee:
1. Ndị mba Briten nọ n'ụlọomeiwu EU ga-atufu ọkwa ha.
Ndị Briten nọ n'ụlọomeiwu EU dị mmadụ 73.
2. Briten agaghịkwa na-eso n'ọgbakọ 'EU Summit' maọbụ n'ọgbakọ EU ndị ọzọ ma ọ bụrụ na enyeghị ha akwụkwọ iji sị ha bịa.
3. Mba UK na mba ndị ọzọ nweziri ike ịkpa nkata maka azụmahịa.
Mgbe UK nọ na EU, ha na mba ndị ọzọ enweghị ike ịkpa nkata azụmahịa n'onwe ha.

4. Ụcha akwụkwọ njirimaraonye nke mba UK ga-agbanwe. 'Passport' nke EU na-acha ọbara ọbara, mana nke mba UK na-acha anụnụ anụnụ.
Mgbe mbụ e bipụtara akwụkwọ 'passport' nke anụnụ anụnụ bụ n'afọ 1921.
5. E bipụtala ego igwe '50 pence' ihe ruru nde atọ nke a ga-amalite iri n'ụbọchị Fraịde.
Ihe e dere n'ahụ ya bụ: "31 January" nakwa "Peace, prosperity and friendship with all nations."

Ebe foto si, PA Media
6. Ngalaba 'Brexit' ga-emechizi ugbua.
Ọ bụ Theresa May mepere ngalaba a n'afọ 2016 iji kpaa ka Briten ga-esi pụọ n'otu EU n'udo.
7. Mba Germany ga-akwụsị ịkpọghachi ndị be ha dara iwu na Briten.
Nke a pụtara na ọ bụrụ na onye Germany bi na UK arụọ ala wee gbalaa mba Germany, agaghị enwe ike ịkpụlata onye ahụ na UK ka ọ bịa zara ọnụ ya.
Iwu mba Germany akwadoghị ịkpọpụ nwaafọ mba ahụ ka e kpee ya ikpe na mba ọzọ.
Ndi isi UK gwara BBC na ọ bụrụ na ihe dị otu ahụ emee, ha ga-arịọ ka a kpee onye ahụ dara iwu ikpe na mba ọbụla ọ gbagara.
Ihe asaa na-agaghị agbanwe

Ebe foto si, Getty Images
1. Ime njem agaghị agbanwe ruo ọnwa Disemba 2020.
Njem ụgbọelu, ụgbọmmiri na ụgbọoloko ga-adịkwa ka ha dị na mbụ ruo mgbe a kpachara maka 'Brexit' nke ọma.
2. Akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala agaghị agbanwe maka ndị UK.
3. Akwụkwọ mkpuchi ahụike (Health Insurance Card) agaghị agbanwe.
Ha ga-adịgide ire ruo mgbe a kpachara maka 'Brexit' nke ọma.

Ebe foto si, Alamy
4. Ndị mba Briten bi na obodo EU nakwa ndị EU bi na Briten agaghị enwe nsogbu ọbụla.
Ha ga-enwe ikike ibi na mba ọbụla ha chọrọ ma nwekwaa ikike ịrụ ọrụ na mba ebe ha bi.
5. Ndị UK bi na mba EU ga na-anata ụgwọ ezumike nka ha (pensions) dịka ha si emebu na mbụ.
6. Mba UK ga na-atụ ụtụ n'akpa EU ruo mgbe a kpachara 'Brexit' nke ọma.
7. Nzụkọrịta ahịa n'etiti EU na UK ga na-aga n'ihu dịka ọ dị na mbụ.








