UK Election : Ihe mmeri Boris Johnson pụtara n'okwu Brexit?

Ebe foto si, Reuters
Onyeisi pati Conservative na mba Briten bụ Boris Johnson ekwuola na ya ga-akwụghachị ndị turu pati ya vootu na ntuliaka e mere iji hopụta pati ga-achị mba ahụ.
Pati Johnson nyere ndị na-azọsị ha ọchịchị bụ Labour pati mmeri pụrụiche dịka ha meriri ha ma n'ebe a na-ahụ ka ebe ndi kwadoro ha ka.
N'okwu Praim Minista Johnson kwuru ka a na-eche ka a kpọọ onye meriri oche abụo fọrọ, ọ sị na mmeri pati ha gosiri na ndị Briten kwụ ya n'azụ n'okwu Brexit.
Jeremy Corbyn bụ onyeisi Labour pati n'onwe ya kwenyere na pati Conservatives kurur ha isi aba okpu na ya bu ntuliaka.
Ọ sị na ya agaghị abụ onyeisi pati Labour ruo oge a ga-eme ntuliaka ọzọ.
Kedu ihe mmeri a pụtara?

Ebe foto si, Getty Images
Okwu akpụ n'ọnụ were banye ntuliaka bụ Brexit.
Boris Johnson so n'ime ndị kwadoro atụmatụ Brexit a nke butere ntuliaka eji jụọ ndị mmadụ ma ha achọrọ ịnọ n'EU maọbụ ha chọrọ ipụ.
Ntuliaka a emere n'usoro "referendum" kpọtụru n'ụbọchị 23 nke ọnwa Juun afọ 2016.
Ka emechara ntuliaka a ndị chọrọ ka Briten pụọ na EU ji pacenti 52 merie ndi chọrọ ka anọdụ nwetere pacenti 48.
David Cameron - bụ onye na-achị n'oge ahụ - rituru n'ọkwa nke mere ka Theresa May malite ọchịchị.

Ebe foto si, Getty Images
Mbo niile Theresa May gbara ịhụ na Brexit mere amịtaghị mkpụrụ nke mere ya onwe ya jiri rituo n'ọkwa.
Boris Johnson rigoro n'ọkwa were malite njem Brexit a mana atụmatụ owepụtara adabaghị.
Ugbua ọ na-ahụ mmeri onwetere na ntuliaka a dịka ikike ọha nyere ya ị ga n'ihu mee Brexit n'usoro ọ chọrọ.

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị bụ Brexit?
Brexit bụ atụmatụ mba Briten jiri chọọ ịpụ na mmekọ mba Yurope akpọrọ "European Union" (EU).
Brexit pụtara - "British Exit" - nke bụ ọpụpụ Briten na EU.
Kedu ndị so n'European Union

Ebe foto si, Reuters
Mba 28 so n'ime EU. Atụmatụ a na-enye ha ohere ịtụ mgbere na mmadụ ịgagharị na mba ọbụla ha chọrọ na-enweghi nsogbu.
Mba Briten banyere EU n'afọ 1973 (n'oge ahụ, ama ya ka "European Economic Community).
Yabụrụ na UK pụrụ, ha ga-abụ mba mbụ si EU pụọ.










