Week in Review: Ihe ndị mere izu a ji bụrụ atakata agbọọ

Kobe Bryant na nwa ya Gianna... na Enyinnaya Abaribe

Ebe foto si, Getty Images/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọtụtụ ihe akụkọ ọjọọ mere n'ọnwa Jenụwarị a nke mere ụfọdụ ndị mmadụ ji ekpe ekpere ka ya bụ ọnwa bịa n'isi njedebe.

Dịka izu a bụ nke ikpeazụ n'ọnwa Janụwarị afọ 2020, lee akụkọ ụfọdụ mere ka ọnwa a bụrụ kpọkịrịkpọ.

Enyinnaya Abaribe

Aha onyonyo, Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ.

Abaribe bụ onye na-anọchite anya Abịa-South n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa.

Ihe mere aha ya jị daa ụda n'izu a bụ maka na ọ gwara onyeisiala Muhammadu Buhari sị ya rituo n'oche ọchịchị n'ihi na ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na Naịjirịa.

Okwu ya juru ọtụtụ ndị mmadụ afọ, mana ọ tọghị Buhari ọchị chaa chaa.

Ọnwụ Kobe Bryant

Kobe Bryant na nwa ya Gianna

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kobe Bryant na nwa ya Gianna

Kobe Bryant bụ nwaafọ Amerịka e ji bọọlụ nkata mara.

N'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Janụwarị ka akụkọ pụtara na Bryant anwụọla.

Ọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta.

Ya na nwa ya nwaanyị bụ Gianna na mmadụ asaa ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ahụ.

Ọnwụ Bryant na Gianna gbawara ọtụtụ mmadụ obi.

Ịba Lassa

Aha onyonyo, Lassa Fever Outbreak:Etu e si lie nwaanyị Lassa Fever gburu

O teela ịba Lassa (Lassa Fever) nyewere nsogbu na Naịjirịa.

Mana ọ malitekwara ọzọ n'ọnwa Janụwarị afọ a.

Ka ọ dị ugbua, mmadụ abụọ anwụọla n'Enugwu.

Ọtụtụ ndị ọzọ anwụkwaala n'akụkụ Naịjirịa ndị ọzọ.

Nje Coronavirus

Pedestrians wear facemasks in Macau

Ebe foto si, Getty Images

Ọrịa ọjọọ 'Coronavirus' malitere n'obodo 'Wuhan' dị na mba Chaịna.

Mana ọ gbasaala ọtụtụ mba ndị ọzọ ugbua nke mere ka onye ukwu na onye nta chịrị obi n'aka.

Ọ batabeghị mba Afrịka ugbua, mana otu ahụike mba ụwa bụ WHO agwala onye ọbụla ka ha kee nkwụcha.

Ụgwọọnwa NYSC

Ndị NYSC

Ebe foto si, Twitter/NYSC

Nkọwa foto, Onyeisi na ndị otu NYSC

N'izu a ka gọọmentị etiti kwupụtara na ha etinyela ego n'ụgwọọnwa ndị ji otu afọ efe ala nna ha a kpọrọ NYSC n'ịchafụ.

Ha buliri ụgwọọnwa ahụ site na N19,800 ruo N33,000.

A malitere kwụwa ụgwọ ahụ n'uju n'ụbọchị Fraide.

Burna Boy

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Obi lọrọ ọtụtụ mmadụ mmiri dịka ntuurugo 'Grammy Award' kwara Burna Boy.

Ọtụtụ tụrụ anya na Burna ga-erite nturugo a, mana nke ahụ emeghị.

Onye nwetara nturuugo ahụ bụ Angelique Kidjo onye mba Bene repọblik.

Ado Doguwa

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ado Doguwa bụ onye omeiwu nta na-anọchi anya mpaghara Doguwa/Tudun Wada dị na Kano steeti.

Doguwa kpọrọ ndị nwunye ya anọ gaa ọgbakọ ndị omeiwu n'ụbọchị Wenezdee izu a.

O kwuru na ihe o ji mee nke a bụ iji gosi na ọ bụ nwoke siri ike ma n'ụlọ omeiwu ma n'ụlọ ya.

O kwukwara na ụmụnwaanyị ahụ nyere ya ụmụ 27.

Akụkọ Doguwa ka na-ewu na soshal midia

Brexit

Ụfọdụ ndị mmadụ na-enwe aṅụrị maka Brexit

Ebe foto si, Getty Images

https://ichef.bbci.co.uk/live-experience/cps/624/cpsprodpb/vivo/live/images/2020/1/31/a09b28cf-896d-4dd6-b573-6370043a9b1a.jpg

N'izu a ka mba Briten si n'otu European Union pụọ.

Ọpụpụ ha kụụrụ ọnụ n'abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ụmụnwaanyị Imo emeela ngaghariwe maka nchụda Ihedioha