Hanan Buhari's Sim card: Ụlọọrụ onyeisiala gbochiri onye ọrụ ụlọikpe inye ha akwụkwọ ụlọikpe- Ọkaiwu

Ebe foto si, Hanan Buhari/Getty
I chetara akụkọ maka Anthony Okolie bụ onye ndị uweojii nzuzo kpọchiri izụụka iri maka ịzụ ma nweghara 'sim card' bụbụ nke nwa onyeisiala Muhammadu Buhari aha ya bụ Hanan Buhari?
Akụkọ pụtara taa na-ekwu na onyeọrụ ụlọikpe ukwu dị n'Abuja gara iweghara Hanan Buhari akwụkwọ ikpọ oku mana ndị ọrụ onyeisiala enyeghị ya ohere.
Anthony Okolie,bụ nwa amadi ahụ a tụnyere na mkpọrọ ndị DSS abalị gbara Hanan, DSS na ụlọọrụ MTN akwụkwọ n'ụlọikpe ma na-ekwu ka ha kwụọ ya nde narị naira ise maka ijichi ya.

Ebe foto si, @HananBuhari
Ọkaiwu Okolie bụ Tope Akinyode gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo n'ekwenti na ha gbara akwụkwọ n'ụlọikpe n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2020 ka ndị ometụtara kwụọ ụgwọ megide e begidere onye ọ na-ekwuru.
"Mana oge onye ụlọikpe gara inye ha akwụkwọ, ha jụrụ ịnabata ya."
Ha kwuru na ha amaghị onye bụ Hana Buhari. Na onye bi n'obi ụlọrụ gọọment bụ Muhammadu Buhari."
Akinyode kwuru na ka o si na dị,na ha ga-alachi n'ụlọikpe rịọ ụlọikpe ohere isi ụzọ ọzọ chụwa ihe dị ha mkpa.
Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bashir Ahmad amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị ozi e zigara ya na soshal midia oge akụkọ na-apụta..
Asị asị ooo!!! O nweghi mgbe anyị jiri jụ inye Oyedepo visa Amerịka

Ebe foto si, Dvaid Oyedepo/Twitter
Ụlọọrụ ndị na-enye akwụkwọ ikikere ịbata obodo n'Amerịka ekwuola n'igwe Twitter na o nweghi mgbe ha hapụrụ inye Bishop Oyedepo ikikere ịbata obodo.
O nweghi mgbe anyị jiri hapụ inye onyeisi ụka Winner's Chapel visa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndị Ọkada na mere ngagharị iwe na Legọs taa

Ndị ọkada emela ngagharị iwe maka mmachi gọọmenti Legọs sị na ha ga-ebido echi machiwe ha ịgba n'okporoụzọ Legọs.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ha gwara ndị ntaakụkọ dị n'ebe a na-eme ngagharị iwe ha mmachi a ga-eme ka ụfọ ndị a bazie omekome.
Coronavirus eruola UK

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-akọwa na mmadụ abụọ ebutela ọrịa Coronavirus.
Ndị ọrụ ahụike kwuru na mmadụ abụọ ahụ si n'otu ezinaụlọ mana ha ekwuputebeghị aha ha.
"Oteela aka anyị na-akwado maka ọrịa nke pụtara na anyị dị njikere ịlụso ya ọgụ" ka Chris Witty kwuru.
Nke a ga-eme ya mba iri na itoolu ebe ọrịa ahụ ferela kemgbe ọ malitere na mba Chaịna.
Otu PDP emela ngagharịiwe n'Abuja

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-akọwa na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'otu PDP gụnbyere Sịnetọ Enyinnaya Abaraibe na-eme ngagharị iwe n'Abuja maka ọnọdụ ala Naịjirịa
Ha kwuru na ebe ndị ha ga-emetu gụnyere isiụlọọrụ mba Briten, nke mba Amerịka nakwa kọmishọn Yurop.
Ndị na-efe ala nna ha eriwela N33,000 ugbua

Ebe foto si, TWITTER/@NYSC_NG
Ọ dị ka emegharịrị ekeresimesi ọzọ
Ndị na-efe ala nna ha na-amali elu na-enwe aṅụrị na soshal midia dịka amalitere ịkwụ ha naịra puku iri atọ na-atọ ka ụgwọ ọnwa.
Onye dịka Joshua gosiri etu o si aṅụrị nke ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Cheta na ọ bụ abalị ole na ole gara aga ka gọọmentị etiti kwere ha nkwa ịbulite ụgwọ ọnwa ha.
Ọ nụrụ kara ibe ya - WHO

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba WHO na-elekọta ahụike na mba ụwa niile etiela mkpu maka Coronavirus na-agwa ma oke ma nta ha kee nkwụcha n'ebe ọrịa a nọ.
Mkpebi a bịara dịka ha mechara nzụkọ imeụlọ n'ụbọchị tọzde iji mata ụdịrị mkpamkpa ọrịa a na-akpa.
Ọzọ,
Ndị uweojii na Taraba steeti anwụchiela otu nwoke gburu enyi ya nwaanyị na steeti ahụ.
Munda Bala kọwara na ya na enyi ya abụọ jikọrọ aka gbuo enyi ya nwaanyị n'ihi anya ụfụ na oke ihe isike dị n'obodo.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ọgbaa bọọlụ Naịjirịa bụ Bright Enobhakare adịla nkwadobe ịhapụ otu ya bụ Wolverhampton Wanderers sonye ndị Birmingham City.
Mana ka ọ dị ugbua, ekwubeghi ego ole a ga-eji zụrụ ya.
Gere akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a










