Menstrual Cycle: Ihe mere e ji akpaso ụmụnwaanyị nọ na nsọ agwa pụrụ iche n'ala Igbo

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Omenala Igbo na-akwanyere ụmụnwanyị ugwu pụrụ iche.
Ọ dị ọtụtụ ihe kpatara nke a mana otu n'ime ha bụ maka ọmụmụ nwa na.
Ha kwenyere dịka ndị dibịa Bekee kwetere na ihe e ji asị na nwaanyị etozuola ihe e ji nwaanyị eme bụ mgbe o bidoro na-ahụ nsọ ya.
Dịka ọdịdị ahụ ha sị dị, ọbara na-apụ n'ahụ ụmụnwaanyị kwa ọnwa ọbụla.
Oge dị otu a ka a na-ekwu na nwaanyị nọ na nsọ ya.

Ebe foto si, Getty Images
Naanị nwaanyị di ime, nke mụrụ nwa ọhụrụ, nke erubeghị ihe e ji nwaanyị eme, maọbụ ndị afọ ha gbagotere bụ ndị anaghị ahụ nsọ ha.
N'oge ugbua, nwaanyị nwere ike ịnọ na nsọ ya ma na-akpagharị maọbụ eme ihe sọrọ ya.
Mana ọ dịghị otu a n'oge gboo.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe nwaanyị anaghị eme maọ nọrọ na nsọ
N'oge ahụ, nwaanyị nọrọ na nsọ, ọ bụghị ihe niile ka ọ na-eme, ọ bụghịkwa mmadụ niile ka ya na ya na-emekọrịta.
Iji maa atụ nwaanyị nọ na nsọ agaghị esiri di ya nrị ma ọ bụrụ na di ya chiri echichi.
Ọ bụrụkwa na di ya bụ dibịa, nwaanyị ahụ agaghị ahụ di ya anya ganye na oge nsọ ya agwụ.
Ụfọdụ ndị, dịka ndị dinta maọbụ ndị ọka mgba anaghị ekwe abịa nwaanyị nọ na nsọ nso n'ihi na a na-eche na ọ nwere ike iwetara ha chi ọjọọ.
N'oge ahụ, ọ bụ ihe arụ idina nwaanyị nọ na nsọ.
Gịnị kpatara nke a?
Ọkammụta Chigozie Nnabuihe, onye nkuzi asụsụ Igbo na Mahadum Legọs kọwara ihe kpatara nke a.
O kwuru na "Onye chiri echichi bụ onye dị nsọ.
"Ọ bụrụ na o rie nri nwaanyị nọ na nsọ o merụọ nsọ ya."
Joachim Obiejesi, onye okenye si Obodoukwu n'Imo steeti kwuru na "nsọ nwaanyị na-emebi ihe nwoke ji chekwara onwe ya."
Ọ kọwara na tupu ụka Kraịst abata n'ala Igbo, nwoke ọbụla nwere ọgwụ ọ na-eji echekwara onwe ya mgbe niile.
"Ndị oge ahụ na-eche na nsọ nwaanyị na-arụ ọgwụ, ya mere ha anaghị achọ ka nwanyị dị etu ahụ ruo ha nso."
Mana Dọkita Bekee bụ Mcginger Ibeneme kọwara na ọ bụghị maka ọgwụ, ọ bụghịkwanụ maka mmegbu ụmụnwaanyị.
Ibeneme kọwara na ọ bụ ugwu ka a na-akwanyere nwaanyị nọ na nsọ, ọbụghị mmegbu.
O kwuru sị: "Nsọ nwaanyị bụ ihe nrụtụ aka maka ọmụmụ nwa, nke a kpatara e ji akwanyere nsọ nwaanyị ugwu pụrụ iche."
"Ihe ọzọ kpatara e jighi ekwe ka ha sie nri maọbụ chuo mmiri bụ maka na ọbara na-apụ ha n'ahụ, nwere ike mebi mmiri ma ọ banye ya ịchụta mmiri."
"Ọ bụ maka ahụ ike ha na nke ndị ọzọ ka e ji asị ha nọrọ otu ebe ruo mgbe nsọ ha kwụsịrị."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:












