Igbo Culture: Ihe mere e ji kwụsị ịgba mbarị n'obodo anyị
Ndị ichie obodo Imerienwe kọwara ihe mere ha esoghi ụkpụrụ ndị nna nna ha n'omenala ịgba mbarị.
Ha gwara BBC Igbo na mbarị bụ omenala ha zutere dịka a mụrụ ha, na onweghi onye dị ndụ ugbua nwereike ịkọwa mgbe ọ malitere.
Dịka e si kọrọ ha, ndị na-agba mbarị na-anọkọ otu ebe were ọmụ na akịrịka gbachie onwe ha ruo ihe ruru afọ abụọ.
Ndị a ga-amalite iji aja ụrọ na nzụ na-akpụ ụzụ dị iche iche n'ime afọ abụọ ha ga-anọ n'ime mbarị a.
Mgbe ha kpụchara, ha ga-agba ya n'anwụ ka ndị ọha nwee ike hụrụ ihe ha kpụrụ
Ha kwuru na ụfọdụ na-ahụta ya dịka agbara maka na ọ na-akụgbu onye mere ihe ọjọọ n'oge ahụ..
Ndi ichie kwuru na ọ bụ mgbe ụka Kraịst batara n'obodo, ka a kwụsịrị ịgba mbarị n'obodo ha ma were ya mere zie ebe nlereanya.
Ndị mepụtara ihe nkiri a bụ Ikechukwu Kalu na Vining Ogu