Nnamdi Kanu: O bola ọnwụ nne ya n'isi ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Image
Nne onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra (Ipob)' bụ Ugoeze Sally Nmeme Kanu anwụọla.
Nwa ya nwoke bụ Nnamdi Kanu kwuru na nne ya nwụrụ kemgbe ụbọchị iri atọ (30) nke ọnwa Ọgọstụ mana o bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba ka o kwuputara ya.
N'ime onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia, o toro nne ya maka etu o si kwado mbọ Ipob na-agba ịnweta Biafra mgbe ọ dị ndụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Kanu kwuru na ọ bụ ihe mgbu na obi mgbawa si n'egwu eke ndị Naịjirịa mere n'afọ 2017 na be ha n'Afaraukwu dị n'Ụmụahia, Abia steeti, gburu nne ya.

Ebe foto si, Rev Chuwkudi Peace
Ihe ndị Ipob kwuru maka ọnwụ nne Kanu
Ụkọchukwu Chukwudi Peace gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbe ọbụla sọrọ Kanu ka ọ ga-eji ekwupute ọnwụ nne ya makana onweghị onye ọ gbasara.
O kwuru na ọ bụghị ihe ọhụrụ na Kanu ji ugbua ekwupute maka ọnwụ nne ya mere n'Ọgọstụ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ nne Nnamdi Kanu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mberede okporoụzọ ejidela otu onye n'Ọnịcha
Akụkọ si Ọnịcha eru anyị ntị na-akọwa na ụgbọala pịara otu nwaanyị gwogwo n'okporoụzọ e si abanye Ọmọba (bụ ebe ọkụ tanka gbara ụgbọala 22), na mgbede ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba.
Nwaanyị ahụ nke a na-amabgehi ma ọ nwụọla pịị tọgbọrọ n'okporoụzọ, mana ndị mmadụ gbara ya gburugburu na-ekwu na ọ nwụọla.
Ndị mmadụ hụrụ ka ihe mberede a mere, kwuru na onye na-akwọ ụgbọala kụrụ nwaanyị a ka ọ na-achọ ịgbafe n'ụzọ, ma hapụ ya gbalaga ka ọ hụrụ ihe o mere.
N'ihe nkiri si n'ọgbọ ahụ pụta, onye ntaakụkọ BBC hụrụ ka ndị ọrụ ha bụ ichekwa ụzọ nke a na-akpọ Federal Road Safety Corps (FRSC), gara ka ha mara ihe a ga-eme.
Gọọmentị agwala MTN na ndị ọzọ kwụsị ịna ego maka USSD
Ị na-eji MTN gị ekesa ego nke Bekee na-akpọ Bank Transfer? Ụjọ atụla gị makana ha agaghị ana gị ego USSD.
Nke a bụ makana minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Isa Ali Pantami, enyela iwu ka ha gbaa brake ruo mgbe ọ tulechara ya, makana ọ sị na ọ maghị maka ya, nke o ji edo ya anya.
Gụọ ya n'uju ebe a: Ụjọ atụla gị MTN agaghị ana gị ego USSD
Ngagharịiwe ndị Hong Kong

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, ndị mba Họng Kọng egosila na ha bụ isi ekwe ọnwụ dịka ha jụrụ ịkwụsị ngagharị iwe ha malitere kemgbe izu iri abụọ gara aga.
Ọ bụ otu iwu ọhụrụ e wepụtara nke ga-eme ka e nwee ike ịkpọpụta ndị a na-enyo maka mpụ n'ike ma kpọba ha Chaịna, kpalitere ngagharịiwe a.
Lee ndị meriri na Headies 2019

Ebe foto si, NANCY ISIME/INSTAGRAM
Lee ụfọdụ ndị meriri nke afọ a.
Ogụegwu nke afọ 2019.
'Burna Boy'
Egwu kacha n'afọ 2019
'Burna Boy'
Onye a na-atụanya ịkpa ike n'ọdịniihu
'Rema'
Onye kacha emepụta egwu nke afọ 2019
'Killer Tunes'
Ọgụegwu olu ya kacha mma
'Teni'
Nchịkọta egwu n'afọ 2019
'Falz'
Ihe onyonyo egwu kachasị
'Clarence Peters'
Onye meriri 'Best Performer'
Yemi Alade
Ụlọ mkpagbu ọzọ ji mmadụ 147 na Kaduna

Ebe foto si, Getty Images
Achọpụtala ụlọ mkpagbụ ọzọ ji ndị mmadụ otu narị iri anọ na asaa na Rigasa,nke dị na opkuru ọchịchị Igabi, Kaduna steeti.
Ha dị ụmụnwoke otu nari iri anọ na asaa, ụmúnaanyị iri abụọ na abụọ ebe ọtụtụ ha bu ịga ma ụfodụ kwukwara na a na-awakpo ha n'ike.
Ọ bụ Gọvanọ Kaduna steetị bụ Nasir El-Rufai na ndị uweojii soro zọpụta ndị a.
Onyeisiala bụ Muhammadụ Buhari katọrọ mkpagbụ ndị a ma nye ndị nchekwa ikike ichopụta ndị ọzọ ebe ọbụla ha di.
Enwetela Ọdụm gbapụrụ n'ogige a na-edewe anụmanụ na Kano

Ebe foto si, Getty Images
Ọdụm bi n'ogige a na-edewe ụmụ anụmanụ dị na Kano agbapụla na-ebe edewere ya.
Ndị na-elekọta ya sị na ọ bara ebe ewu nọ were nyere onwe ya aka ma rijuo afọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Ha sị ka ndị mmadụ hara itu egwu n'ihi na ha anwụchiela ya bụ Ọdụm.
Atọrọla otu onyeisi ndị uweojii

Ebe foto si, Getty/AFP
Ndị ntọ ekwuola na ha chọrọ nde Naira iri ise tupu ha ahapụ onye uweojii na-achịkọta ndịuweoji na Suleja aha ya bụ Isa Rambo ha tọrọ.
A tọrọ Rambo bụ onye eneyemaka Kọmishọna mgbe o si Kaduna a ga Jos na ụtụtụ Saturday.
Ọnya Boko Haram amaala Boko Haram

Ebe foto si, Getty Images
Ọnya Ogbunigwe ndị Boko Haram liri n'ala egbuola ndị otu ha asaa ma mee ka asatrọ n'ime bụ daa ngwụrụ.
Ọ bụ ebe ha na agba ọsọ dịka ndịgha Naịjiria na akwa ka mgbọ ka ụbgọala ha riri ya bụ ọgbunigwe elu.
Nke a mere na ime ọhịa Lamb'a.
Ka ọ dị ụgbụa, ndịagha NAijirịa na echekwa mpaghara a.
N'Ofesi
Brexit

Ebe foto si, Getty/BBC
Onyeisiala mba Briten bụ Boris Johnson edegerala ndị EU akwụkwọ ka enye ha oge karịa ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Oktober maka Brexit.
Nkea bụ maka iwu ndị omeiwu nyere ya, kama Boris Johnson degekwara ndị EU akwụkwo ọzọ were sị ha na Brexit igafe ụbọchi amara ọkwa ya dị njọ.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, @NGSuperEagles
Ndị otu sụper Eagles agaghi eso zọọ ikọ asọmpi 'African Nations Championship'nke afọ 2020 dịka ndị Togo ji ọkpụ goolu anọ ha satara atọ were gbapụ ha.
Togo ji goolu anọ ha satara otu were merie ndị Super Eagles na agba nke mbụ maka ntozu asọmpị CHAN.
Ndị Super Eagles na-atụanya na ha ga abụkwara ma nye goolu karịrị abụọ mgbe ha ga-ezute na Legos.
Kama nke a bụ akụko ifo dịka ndị
Akụko Ga-Amasị Gị











