Nigeria's oldest prisoner: Nwoke dị afọ 100 a maburu ikpe ọnwụ anwụọla

Ebe foto si, Global Society for Anti-Corruption
Chisom nwa Celestine Egboluche gwara BBC Igbo na nna ya kubiri ume n'abalị 18 nke ọnwa Ọktoba 2019, n'ụlọ ya na Pọtakọt.
Chisom kwuru na tupu nna ya anwụọ, na ọ narala ya nri rie ọfụma (ọ naghị eribu nri ọfụma ka o si ụlọọgwụ lọta), mana o rughi otu awa o richara nri ahụ, o kubie ume.
Chisom kwuru na ọ na-eche na ọ bụ obi mgbawa mere nna ya ji nwụọ mgbe ọ nwụrụ, n'ihi na ọ jụgidere ese nwa ya nwoke bụ Paul a tụrụ ya na ya nga, ruo mgbe ọ nwụrụ.
O kwuru na o legidere anya ịhụ Paul bụ onye a hapụrụ n'ụlọmkpọrọ ka a tọghapụrụ ya, mana ọ hụghị ya ruo n'oge ọnwụ ya.
Chisom kọwara etu nna ya si na-ajụkwa ese nwunye ya, na-amaghị na ọ nwụrụ kemgbe afọ 2015 (maka ọnọdụ ya, o kweghị agwa ya na ọ nwụọla).
Celestine jụkwara ese nwa ya nwoke nke abụọ, na-amaghị na Chisom na onwe ya ahụbeghi ya anya kemgbe afọ 2015.
Chisom kwuru na ya magahị ma nwanne ya nwoke ahụ ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ.
O kwuru na nna ya gbakechaghịkwa n'ọrịa a nọ na-agwọ ya ka o si n'ụlọmkpọrọ pụta, tinyekwuo afọ ole ọ dị (100), nke mere ka ọ ratụ obere ahụ ịnabata ọgwụgwọ ọfụma.

Ebe foto si, Global Society for Anti Corruption
Etu obi dị Chisom
Chisom kwara arịrị maka etu nwụchi nna ya si tụgharịa ihe niile gbasara ndụ ha.
O kwuru na a nwụchiri Celestine n'afọ 2000, mgbe Chisom ka dị naanị afọ 15, nke mere ka ọ ghara ịgụchapụ akwụkwọ, wee kwụsị na nke Bekee kpọrọ JSS2.
O kwukwara na ndị obodo ha n'Amachara dị n'Owerre-Akọkwa dị n'Imo steeti, gara kutuo ụlọ nna ya, nke bụ na ugbua, amabeghi ebe a ga-eli ozu Celestine.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Celestine dịka nwa ya nwaanyị si kwuo
- A mụrụ ya n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst 1918
- Ọ bụbụ onye ojiegoachụego n'ugwu awụsa tupu nsogbu afọ 1966 achụlata ya Ọwụwa-anyanwụ.
- Ka ọ lọtara Ọwụwa-anyanwụ, o bi n'Ọnịcha ebe ọ malitere ịkwa/ịdụ akwa.
- O mechara laa n'ime obodo ya ebe ọ nọkwa na-adụ/akwa akwa.
- Ọ chọburu ichi fada ndị ụka Katọlik, nke mere o ji ghara ịlụ nwaanyị n'oge, mana o nweghizi isi n'ihi na ọ hụghị onye ga-akwado ya.
- Ọ mụrụ ụmụ anọ; Ada ya nwụrụ n'afọ 2005 ka ọ nọ na mkpọrọ, Paul nọ na mkpọrọ, nke nwoke nke ọzọ na-efu efu ebe naanị Chisom nọzị.
- Ọ nọrọ afọ 18 na ụma na mkpọrọ site n'afọ 2000 ruo Juun 2019 mgbe a tọhapụrụ ya.
- Ya na Paul nwa ya na-ekwu na aka ha dị ọcha n'ebubo ịtọrọ nakwa igbu mmadụ ka a na-azọ ala.
Chisom na onwe ya na-arịọ gọọmentị ka ha gbaa mbọ hụ na a tọhapụrụ Paul nwanne ya makana ọ bụ naanị ya ka ọ fọzịrị ya.
Ọ na-ekwukwa na ọ ga-amasị ya ka e lie nna ya n'obodo ha n'Akọkwa ebe ọ na-akọwa na ọ dịzị ka ebe ama ha shiri.
Akụkọ ga-amasị gị:









