Kano Emirate: Ndị gọvanọ a na-etinye anya n'ịhọpụta eze ọdịnala?

Ebe foto si, Patrick van Katwijk
Akụkọ na ụlọomeiwu Kano Steeti ochịchị ocheeze kachasị na Naịjirịa bụ 'Kano Emirate' n'ime ụzọ ise ebutela arụmụka dị iche iche n'etiti ndị Naịjirịa dịka ụfọdụ na-ekwu na atụmatụ abụ iji kpaa Emir Muhammadu Sanusi nku n'ihi ikike e che na onwere na n'ebe gọọmentị steeti ahụ nọ.
Akụkọ banyere Ocheeze Kano malitere kamgbe narị afọ iri na ise, nke jupụtara n'agha jihad nakwa mmeri dị iche iche, kamgbe afọ 1903, Kano enweela udo n'obi ọchịchị. Mgbe ụfọdụ, a na-echi mmadụ Emir mgbe onye nke ji ọkwa ahụ nwụrụ.
Kano nwere okpuruọchịchị dị 44 nakwa ọnụọgụgụ mmadụ dị nde 9, nghazigharị ikike ocheeze Emir nwere ga-ahụta ga-eme ka okpuruọchịchị otu Emir nwere bụrụ zie iri. Nghazigharị nke ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ ụjọ ga-emebi ikike ọchịchị Emir na steeti ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Iwu a ụlọomeiwu Kano wepụtara nakwa aka gọvanọ ha bụ Abdullahi Umar Ganduje tinyere na ya n'ụbọchị Wednezde 8 Mee, ọchịchị Emir nke Kano nke kaịrị afọ narị abụọ, ahụtala mgbanwe ọhụrụ.
Iwu a ga-eme ka Emir nke Kano Muhammdu Sanusi bụ otu n'ime ndị eze kachasị pụta ihe na Naịjirịa nwere zie naanị otu n'ime ụzọ ise ekere obi ọchịchị ya. Ekewapụtala oche eze anọ ọhụrụ bụ nke ga-enwe ndị Emir nke ha.
"Ọchịchị nwa bekee emetụghị ọchịchị Kano aka etu e ji metụ ya aka n'ụbọchị a" dịka ọkanmụta Tijjani Naniya nke ngalaba akụkọ na Mahadum Bayero dị na Kano. Ọ kọwara nkewapụta obi ọchịchị ọhụrụ dịka mmetọ akụkọ ndị bụ nke e kwesighi ịnabata ka ọ kwụrụ.

Ebe foto si, ISSOUF SANOGO
Gọọmentị Kano Steeti na-ahụta ya n'ụzọ ọzọ. N'ozi ha wepụtara, ha kwuru "mkpebi ikesa ọchịchị eze bụ iji bute mmụta omenala bịa nso n'ebe ndị obodo nọ".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ọkanmụta a kwuru na o kwere na atụmatụ ikewa ọchịchị eze ụzọ ise agaghị anọte aka dịka gọvanọ Abubakar Rimi chiburu Kano nwara ya n'afọ 1982 mana ọ mara afọ n'ala na-erughi otu afọ.

Abdullahi Sani bụ onye bi na Kano kwuru na ọ dị afọ iri anọ na ọ bụkwa ọchịchị eze Kano ka ọ mara ma hụkwa n'anya dịka ọ na-etolite.
Saifullah Mukhtar onye ọzọ bi na Kano na-anaghị ahụcha ụzọ kwuru na atụmatụ a dị mma dịka ihe gbasara ndị obodo ga-abụ ihe a ga-ekwu na gburugburu ebe ha na-abụghị ilekwasị anya na Kano dị anya tupu e mee mkpebi.

N'Agbanyeghi na akwụkwọ akụkọ kwuru na ụlọikpe ukwu dị na Kano nọrọ n'ụbọchị Fraịde nye iwu ga-akwụsị ikewa ọchcịchị eze, Gọvanọ e nyela ha ikike ọchịchị na Mọnde.
N'ime ihe niile a, ọ ga-adị mma ka a mata na Kano abụghị Steeti mbụ ụdị ihe a eche na ọ bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị obi eze na-eme na nso nso a.
IMO STEETI
N'afọ 2015, Gọvanọ Rochas Okorocha nke Imo State, Ọwụwanyanwụ, Naịjirịa na Eza ndị Owerri nwụrụ anwụ bụ Eze Emmanuel Emenyonu Njemanze, OzuruIgbo nke ise Owerri nwere ụdị esemokwu a bụ nke Eze a boro Gọvanọ ebube ikewa Owerri nakwa steeti niile.

Ebe foto si, FACEBOOK/ROCHAS
N'ime esemokwu dị n'etiti ha abụọ, a sị na ọchịchị Okorocha gbara mbọ ịhụ na a kwụsịrị Eze Njemanze ọrụ dịka osote onyeisioche ndị Eze na steeti ahụ, n'ihi nkwado a sị na o nwere n'ebe Eze Cletus Ilomuanya nọ, onye achụpụrụ dịka onyeisioche ndị Eze ọdịnala na Imo Steeti.
Gọọmentị steeti gọnarịrị ebubo a ma kwuo "Na aka ya adịghị na ọchụchụ a chụrụ ndị Eze anọ nakwa nyocha a na-eme mmadị iri ise ọzọ n'aka otu jikọtara ndị eze"...Mana gọomentị agaghị egbu oge ime ihe ọbụla otu jikọtara ndị eze kpebiri dịka ọ ga-abụ ihe ga-eme ka Steeti dị mma..."

Ebe foto si, Alamy
Dịka o si mee na Kano, ọchịchị Okorocha kewara obi ọchịchị Eze a n'ime obodo ise nke nwere Eze ha n'otu n'otu.
Taa, Imo Steeti nwere obodo dị 637 nwere Eze ọdịnala nke ha, nke a sị na ọ bụ Gọvanọ Okorocha nyere ha ọkwa ọchịchị.
OYO STATE
Na mpaghara ndịda nke Naịjirịa, Oyo Steeti na nso nso nwere ụdị ndọrọ ndọrọ a n'etiti Oba Saliu Adetunji, Olubadan nke Ibadan na Gọvanọ Abiola Ajimobi.

Ebe foto si, @AAAJIMOBI
N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2017, Ajimobi buliri ọkwa ndị isi obodo dị 21 (Mogajis) nakwa ndị akpọrọ Baales, ma mee ha ndị Oba; nke mere ha ndị Eze zuruoke. Na mgbanwe ọhụrụ a, Olubadan bụ Eze kachasị n'Ibadan ga na-aza 'His Imperial Majesty', onyeisi ya kachasị e mere Oba ga na-aza 'His Royal Majesty' ebe ndị Baale, ga-abụ 'Your Royal Highness'.

Ebe foto si, FACEBOOK/SALIU ADETUNJI
Ndị nkatọ sị na Gọvanọ e mebiela omenala inwe otu Oba n'etiti ọtụtụ ndị isi obodo n'ihi ọkwa ọhụrụ ndị a o nyere. N'aka nke ọzọ, gọvanọ siri ọnwụ " Onweghi omenala na akụkọ obodo ndị Ibadan anyị na-agbanwe kama anyị na-akwadosi ike ma na-ewulite omenala anyị."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Olubadan a mara gọvanọ aka n'ụlọikpe ma gbalịa ka o wepụ mkpebi ahụ. Onye ọzọ katọrọ agwa Gọvanọ Ajimobi kpara bụ onye bụbu gọvanọ Oyo Steeti bụ Alhaji Rasheed Ladoja, onye bụkwa Mogaji ebugoro n'ọkwa Oba mana ọ na-abataghị ya ma katọọ ọkwa ahụ. kwuo, "... Agaghị m abụ Oba na-enweghi obi ọchịchị."
N'ọnwa Jenụwarị afọ 2018, Ụlọikpe ukwu dị n'Oyo Steeti chabiri ikpe ma kwuo na atụmatụ Gọvanọ Ajimobi "ezighi ezi, iwu akwadoghi ya, na ọ bụ ihe efu." Gọvanọ eburula ikpe a gaa n'ụlọikpe mkpegharị.









