Asuu Faction: Otu ọhụrụ a kpọrọ CONUA esila na ASUU kewapụ onwe ha

Ebe foto si, Federal Ministry of Labour
Otu ọhụrụ a kpọrọ 'Congress of University Academics' maọbụ CONUA n'aha ịchafụ esila na otu ndị nkuzi mahadum bụ 'Academic Staff Union of Universities' kewapụ onwe ha.
Otu a kwuru na iwe ha bụ nkụsasị nke Asuu na-akụsasị usoro oge agụmakwụkwọ na Naịjirịa n'ihi oke ịgba arụkwaghịm.
Onye isi otu a bụ Niyi Sumonu gwara BBC na ha na-agba mbọ ugbua idebanye aha otu ọhụrụ ha ka o wee tozuo etozu na Naịjirịa.
Dika Sumonu si kwuo ihe kpatara ha ji kewapụ bụ:
1) Iji mee ka e nwee otu ọzọ ga akwudoro ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi na mahadum.
2) Iji weta ụzọ ọzọ e nwere ike isi mezie esemokwu dị n'etiti gọọmentị na ndị nkuzi.
Sumonu kwuru na ọdịghị mma etu Asuu na-esi agba arụkwaghịm maka obere okwu ọbụla dapụtara n'etiti ha na gọọmentị.
O kwuru na nke a na-ebute nghasa n'usoro agụmakwụkwọ na Naịjiria.
Na nzuko izizi nke Conua nwere n'ụbọchị Satọdee, ndị biara nzukọ ahụ bụ ndị nkuzi Obafemi Awolowo University Ile-Ife; Federal University, Lokoja, Kogi State na Kwara State University.
Ndị ọzọ bụ ndị Ambrose Ali University Expoma, Edo State nakwa Federal University, Oye-Ekiti.
Mana Sumonu kwuru na ọtụtụ ndị nkuzi si ụlọakwụkwọ ndị ọzọ egosila mmasị isonye n'otu ọhụrụ ha.
Akụkọ kwuru na onyeisi Asuu bụ Biodun Ogumyemi sị na ya amaghị maka ndị otu ahụ kewapụrụ ohụrụ.
Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya n'igwe, ọ rịọrọ ka e zitere ya ozi 'SMS' n'ihi na ọ nọ na-nzukọ.
Mana ọ zghachibeghị ozi anyi zigaara ya ruo mgbe anyị wepụrụ akụkọ a.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:












