Chimamanda Adichie bụ onye nke anọ olu ya ka ada ụda n'Afrịka

Ebe foto si, Instagram/chimamanda_adichie
Ada Igbo a ma ama bụ Chimamanda Ngozi Adichie bụ onye nke anọ na ndị kacha nwee agba n'Afrịka niile.
Nke a bụ dịka akwụkwọ akụkọ 'The Africa Report' si depụta.
Akwụkwọ a deturu aha mmadụ otu narị bụ ndị ha sị na okwu ha na-ada ụda n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, iji ego achụ ego, nakwa nka.
Naanị Adichie bụ nwanyị aha ya dị na aha iri e bu ụzọ depụta na ya bụ akụkọ bụ ndị Afrịka ji biri.
Onye nke mbụ aha ya gbara n'akụkọ ahụ bụ Aliko Dangote, nwaafọ Naịjirịa kacha baa ọgaranya n'Afrịka niile.
Ndị ọzọ bụ Elon Musk, Koos Bekker nakwa Trevor Noah ndị mba Saụt Afrịka.
Adichie bụ nwaafọ Igbo e ji ide akwụkwọ mara.
Ihe ọzọkwa e ji mara ya bụ ịkwalite ikike ụmụnwanyị.
Adichie deela ọtụtụ akwụkwọ ma nyekwa ọtụtụ nkuzi n'ebe dị icheiche gbasara ụmụnwanyị, Naịjiria nakwa Afrịka.
Ọ bụkwa onye ihe gbasara asụsụ na omenala Igbo na-anụ ọkụ n'obi mgbe niile.
Nkịtị nkịtị azụọla n'ahịa udele!

BBC Afrịca Eye anwụdela onye nkuzi mahadum Legọz ahụ na-atọ bịrịbịrị, na-anaghị ekwe ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.
Ugboro ugboro ka ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị na mahadum na-ekwu na ndi nkuzi ha na-enye ha nsogbu iji dinaa ha.
Mana mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị ekwetacha ihe ha na-ekwu
Mana aka akparala ezekudele, ọ ga-ekwuzi mmụọ chiri ya ọzọ.
Ụmụakwụkwọ a tọọrọ na Kaduna

Ebe foto si, Reuters
A ka na-achọ ụmụakwụkwọ sekọndịrị nke Engravers College na Kaduna bụ nke ndị ntọrị nwụụrụ kamgbe abali anọ gara aga.
Akụkọ na-ekwu na ndị ntọrị ahụ na-akpọ aha ego iji hapụ ụmụakwụkwọ ahụ mana ndị uweojii Kaduna steeti sị na ha na-anwa oke ha ịchọta ha.
Cheta na ndị ntọrị wakporo ụlọakwụkwọ ahụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọọzde, abalị atọ nke ọnwa Ọktoba, ma tọrọ ụmụakwụkwọ isii na ndị nkuzi abụọ.
Gọọmentị Kaduna kwekwara nkwa na ha ga-eme ihe niile ha nwere ike ịchọta ndị ahụ a tọọrọ.
Ihe mgbu Trump abawanyela

Ebe foto si, AFP
Okwu gbasara nchutu onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-arịwanye elu gbasara mkparịtaụka ya na onyeisiala mba Ukraine nwere n'ekwe ntị oge gara aga.
Ugbua, ha adịla mmadụ abụọ bụ ndị na-ebo Trump ebubo agwa ọjọ gbasara ya bụ mkparịtaụka.
Mana Trump ka na-esi ọnwụ na onweghị ihe ọjọọ o mere.
Ese Brume emechapụtala Naịjirịa ihu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị mmadụ ka kpụ Mercy n'ọnụ n'ihi mmeri o meriri n'ihe omume Big Brother Naija, mana ihe ukwu mekwara na Doha na mba Qatar.
Ese Brume, riteere Naịjiria ola mbụ nke egwuregwu 'athletics championship' bịara n'isi njedebe ụnyaahụ mgbe o nwetara ọla nchara n'asọmpi 'Long jump'.
Nke a bụ naanị otu ọla Naịjirịa nwatara na ya bụ egwuregwu 'International Association of Athletics Federations' IAAF.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











