Catholic Bishops: Pope a ga-ekwe ka ndị 'Fada' bido lụwa nwaanyị?

Ebe foto si, AFP
Okwu gbasara ndị 'fada' ịlụ nwaanyị abụghị nke malitere taa mana e dịkwaka enwere ike isu ya kpọm taa.
Ndị ụkọchukwu ụka Katọlịk si akụkụ mbaụwa niile ezukọla ka ha kpa ihe dị iche iche dịka mgbanwe eluigwe, mbịara mbịara, mana isi sekpụ ntị na ha niile bụ ma ụmụnwoke nụrụla nwaanyị a ga-bunwu ụkọchukwu.
Otu ihe kwụpụtara n'akwụkwọ eji eme nzụkọ a bụ atụmaatụ nke gunyere ka ndị agadị nwoke lụgoro nwaanyị bi na Amazon na-echi ụkọchukwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Akwụkwọ a na-ekwukwa na agadị nwoke ndị a ga-abụrịrị ndị na-akwanyere onwe ha ugwu ma sikwa n'ebe ha chọrọ ịnọ rụọ ọrụ chukwu.
Ndị Ụkọchukwu nọ na Saụtụ Amerịka tụtara alọ a ka e wee gbochie nsogbu ụkọ ndị ụkọchukwu n'ogbe ahụ.
Nsogbu a butere na a naghị aka 'Masi' n'ọtụtụ ebe n'obodo ahụ.
O nwere ihe dị njọ n'atụmaatụ?
Ọtụtụ ndị na-ahụta ndị ụkọchukwu dịka ndị na-ekwesighị ịlụ nwaanyị dịka ọkwa ahụ si nye makana ọ bụ Chukwu na-alụ ya.
Okammụta Linda Woodhead MBE kwuru na a na-enye ndị 'Fada' ihe ọbụla ha chọrọ dịka ego ụlọ na ego ha ga-eji na-egbo mkpa ka ha wee rụọ orụ ha ọfụma.
"Ndị mmadụ na-abịakụte 'Fada' dịka onye na-enweghị ihe ọbụla ha nwereike ịna-eze, ụkọchukwu ahụ ga-anatụ anya ha , nke a bụ ihe kachasị mkpa," n'okwu ọkammụta Woodhead.
Ndị omenaala na-ekwu na ya bụ nzụkọ a na-enwe n'obodo Amazon nwereike ịla ụka n'iyi ebe ụfọdụ ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na amalite ya bụ atụmaatụ na ọ ga-emebisi alụghị nwaanyị ndị ụkọchukwu Katọlịk.
Ha na-echekwa na enwereike ịtụta alo gbasara udiri echichi ụkọchukwu a gana-echi ụmụnwaanyị nke ga-eme ka malite chiwe ha ụkọchukwu.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mparịtaụka a
@3Loretto kwuru na ọ gaghị ekwe ka atụmaatụ ọjọ a gaa n'ihu.
@selicia_f kwenyere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@ThomasJTobin1 kwuru na o nweghị ihe ndị mmadụ ga-emeli maka ya bụ mkparịtaụka n'ọgbakọ ahụ kama ha kpe ekpere maka ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3











