Teachers' Day: Etu Anambra si kpokọrọ nturugo nke onyeisiala

Ebe foto si, AFP/getty images
Ndị nkuzi nọ n'Anambra steeti ritere nturuugo anọ n'aka onyeisiala Muhammadu Buhari dịka e mere ncheta ndị nkuzi n'ụbọchị ise nke ọnwa Oktoba.
Nturuugo a bụ nke a na-enye ndị nkuzi na ụlọakwụkwọ bụ ọkaibe na Naịjirịa dịka ụlọọrụ mgbasaozi "Anambra Broadcasting Commision"(ABS) si depụta.
Nturuugo ha ritere gụnyere
- Ụlọakwụkwọ bụ ọkaibe na nchịkọta ụmụakwụkwọ na Naịjịrịa gaara Maria Regina Model Comprehensive Secondary School dị na Nnewi
- Ụlọakwụkwọ ọha bụ ọkaibe na Naịjirịa gaara Flora Azikiwe Model Secondary School dị na Neni.
- British Spring College Awka site n'aka onye nkuzi ha bụ Arinze Izuegbunam ritere nturuugo n'ogo mbụ ọkaibe n'ụlọakwụkwọ naa-abụghị nke ndị gọọmenti
- Samuel Izuegbu na-akụzị na 'Community secondary School' dị n'Owerri Ezukalla ritere ogo nke abụọ na nturuugo ọkaibe n'ụlọakwụkwọ ọha.
Onyeisiala Buhari site n'ọnye nnọchite anya ya na mmemme ya bụ okaipe ukwu nke Naịjirịa bụ Abubakar Malami SAN, kwuru na obi dị ya ụtọ maka isiokwu ncheta ndị nkuzi nke afọ a makana ọ gbadoro ụkwu na etu ndị nkuzi ga-esi na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe ndị ga-enyere nwulite obodo aka akwụsị akwụsị.
O kwukwara na a ga-enwetali agụmaawụkwọ zuruoke na Naịjirịa site na nnabata, nghọta, nakwa ịnwe nghọtata maka ndịche ụmụakwụkwọ ụfọdụ nwere.
Kọmishọna na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Anambra steeti bụ ọkammụta Kate Omenugha kwuru na mmeri a gosiri na nkwado gọọmenti Anambra na-enye agụmaakwụkwọ na steeti ahụ abụghị na nkiti.
Cheta na isiokwu nke ụbọchị ncheta ndị nkuzi nke afọ a bụ 'Ndị nkuzi ntoroọbịa: Ọdinihu ọrụ nkuzi.
N'afọ 2017, Clement Nwoye Okodo bụkwa onye Anambra steeti ritere nturuugo onye nkuzi kachasị na Naịjịrịa nke onyeisiala hibere.






