Pope Francis emeela ihe Pope ọbụla emebeghi mbụ

Pope Francis na Eze ndí Moroko

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi ndị ụka Katọlịkị n'ụwa niile bụ Pope Francis emela ihe Pope ọbụla embeghi mbụ mgbe ọ gara njem nleta n'ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị Imam nke ụka alakụba.

Njem a so n'ihe ndị o mere iji kwalite mmekọrịta n'eiti ndị ụka Kristi na ndị na-ekpere Allah na mba ahụ dịka onyeisiala ha siri rịọ ya.

Ihe mere na Akwamozu Eze Aguleri

Igwe ndị ochie nwụrụ n'Aguleri

BBC IGBO nọ n'ọgbọ ebe a na-akwa Igwe Aguleri nwụrụ anwụ a na-akpọ Igwe Christopher Nwabụ nwanne Ijigo nke anọ.

Otu omenala dị icheiche nọ n'ọgbọ ne-emepụta ihe iji kwanyere Igwe nwụrụ anwụ ugwu ikpeazụ.

N'egwuregwu,

Ndị otu Man U

Ebe foto si, Getty Images

Otu Watford eriela goolu abụọ n'aka otu Man U dịka ha zutere onwe ha n'asọmpị Premier Lig taa.

Gụọ akụkọ ahụ n'uju ebe a: Chi ndị Man U azọọla ha n'aka ndị Watford

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa

Aha onyonyo, Ancient wars: Lee ụfọdụ agha Igbo gbara ike na ya

Inec ga-enye pati umengwụ ọsọ

Mahmood Yakubu

Ebe foto si, Getty Images

Inec ekwuola na ha ga-ewepụ aha pati ndị agbanyeghị mgbọrọọgwụ n'akwụkwọ ha.

Ha kwukwara na ha ga-enyonye anya n'etu otu pati dị iche iche si mefuo ego n'ọsọ achụmta vootu ha mere ma e kwucha okwu gbasara mmeju ntuliaka 2019.

Onnoghen agbaghaala ikpe ya

Walter Onnoghen

Ebe foto si, @Crevo360_Ng

Nkọwa foto, Justice Walter Onnoghen

Ụlọikpe pụrụ iche a kpọrọ 'Code of Conduct Tribunal' na bekee ajụla ịnapata arịriọ Walter Onnoghen na ya enweghị okwu ọbụla n' akwụkwọ a gbara ya maka akpọpụtaghị akụ o nwere dịka onyeisi ọkaikpe Naijiria.

Ka nke a na-eme Onnoghen ewegala ikpe ahụ n'ụlọikpe mgbegharị dị n'Abuja sị ka ha wezụga mkpebi 'tribunal' na ọ bụ ikpe mkpegbu.

Trump agbachiela agbata ha na mba Mexico?

Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ha agbachi agbata ha na mba Mexico ịzụụka na-abịa abịa, dịka o na-ebo gọọmenti mba ahụ ịgba nkịtị ndị mbịarambịara sị ala ha awụjụ mba Amerịka.

Ikpa oke agbụrụ akarịala- Ndị nchịkọta bọọlụ

Ndị nchịkọta Premier League

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị nchịkọta Premier League; Guardiola,Klopp, Sarri na Warnock

Ndị na achịkọta egwu bọọlụ na Premier League gụnyere Pep Guardiola na Jurgen Klopp na-eti mkpụ ka elebanye anya n'okwu ịkpa oke agbụrụ nke ha tụrụ arịrị na ọ na-akawanye njọ n'Yurop.