Chimamanda Adichie's mum's death: Nne mụrụ ya alaala mmụọ

CNA

Ebe foto si, Instagram/ChimamandaAdichie

Odeeakwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Ngozi-Adichie gbazi aka nne na nna dịka nne ya nwụrụ.

Akụkọ ruru BBC Igbo ntị kwuru na nwaanyị ahụ aha ya bụ Grace Ifeoma Adichie dị afọ iri asaa na asatọ.

Ezinaụlọ Adichie ekwuputabeghị mgbe a ga-akwa ozu ya nakwa ihe ndị ọzọ.

Cheta na nna Adichie bụ James Nwoye Adichie nwụrụ n'ọnwa Juun afọ gara aga.

Elikwara ya n'ọnwa Ọktoba afọ ahụ dịka akụkọ si kwuo.

chimamanda Adichie

A gụwa ụmụnwanyị Igbo e ji ide akwụkwọ mara, a ga-agunyerịrị Chimamanda Ngozi Adichie.

Ọ ga-ara ahụ inweta nwaafọ Igbo na-anụbeghi maka Adichie.

Ọ bụghị sọ na ụbụrụ ya na-acha ọkụ, Adichie bụkwa olu na ada ụda n'ịkwalite ikike ụmụnwanyị.

Adichie bụkwa onye ihe gbasara asụsụ na ọdịnala Igbo na-amasị nke ukwuu.

Mana ọ dị ọtụtụ ihe ndị mmadụ amaghị maka Ada Igbo a.

Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a:

Aha onyonyo, Chimamanda bụ onye odeakwụkwọ a ma ama na mbaụwa

1. Onye ebee ka ọ bụ?

A ma na Adichie bụ onye Igbo, mana ọtụtụ amaghị obodo o si.

Adichie bụ onye Abba nke dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambara.

Ọtụtụ na-eche na ọ bụ onye Enugwu mana nke ahụ abụghị eziokwu.

Kama a mụrụ Adichie na Enugwu.

2. Amụnyere ya n'ime akwụkwọ

Nne na nna ya bụ ndị ọrụ na Mahadum Naịjirịa nke dị na Nsụkka.

Nna ya bụ James Adichie bụ ọka nkụzi na ngalaba "Statistics". Ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ.

Ọ bụ ya bụ ọka nkụzi mbụ Naịjiria nwere na ngalaba "Statistics".

Nne ya bụ nwanyị mbụ toruru n'ọkwa "Registrar" na mahadu m Nsukka.

3. Ya na Achebe biri n'otu ụlọ

Mgbe Chinua Achebe si n'ụlọ ya dị na Nsụkka kwapụ, ọ bụ nne na nna Chimamanda Adichie kwabara n'ọnụụlọ ahụ.

Ebe ahụ ka Adichie na ụmụnne ya nọrọ too.

Ijikwa n'aka na ọbụghị ebe ahụ ka ụbụrụ e ji ede akwụkwọ si fee ya?

Aha onyonyo, Okwu Chimamanda maka Biafra na Ipob

4. O nwere umunne ise

Adichie nwere ụmụnne ise. Ụmụnwoke atọ na ụmụnwanyị abụọ.

Ọ bụ ya bụ nke ise n'ime ha isii.

5. O nwere "A1" n'Igbo

Ọ bụ eziokwu na ihe e ji mara Adichie bụ iji asụsụ Bekee ede akwụkwọ, mana ọ na-edekwa Igbo nke ọma.

Adichie nwetara nzere "A1" n'asụsụ Igbo n'ule Waec ya.

N'eziokwu, Adichie bụ onye nwetara nzere kacha mma n'ule Waec kamgbe e ji bido ụlọakwụkwọ sekọndịrị nke dị na Mahadum Nsukka ruo taa.

Onye ma ihe ga-eme echi, ma ọ ga-edepụta otu akwụkwọ n'asụsụ Igbo?

6. Ọ lụọla di?

Adichie alụọla di ma mụta otu nwa nwanyị.

Aha di ya bụ Ivara Esege, onye Akwa Ibom State.

Esege bụ Dibia Bekee nwere agba na mba Amerịka.

Onweghị onye ma aha nwa Adichie.

Ọ naghị ekwe agwa ndị ntaakụkọ aha nwa ya.

Mana e nwere otu mbem Adichie dere nke ọ kpọrọ "Dear Ijeawele".

Ụfọdụ na-eche na ọbụ aha nwa ya bụ 'Ijeawele' o ji maka ya dee mbem ahụ.

Aha onyonyo, Okwu Chimamanda kwuru maka ụgwọ isi

7. Di ya na-asụ Igbo

Agbanyeghi na ọbụghị nwaafọ Igbo, Esege di Adichie na-asụ Igbo.

Ọ naghị asụcha nke ọma mana ọ na-agbalị. Ọ na-aghọtakwa nke ọma.

Ọzọkwa, Adichie kwuru na ya ga-agba mbọ ịhụ na ada ya mụtara asụsụ Igbo tupu ọ mụta Bekee.

8. Ndị ntọ yiri ya egwu

N'ọnwa Mee afọ 2015, ndị ntọrị tọọrọ nna Adichie.

Nke a mere ka oke egwu tụọ ya n'ihi na nna ya emeela okenye.

Ọ nọrọ abalị atọ n'aka ndị ntọrị ahụ tupu ha atọhapụ ya.

Mana Adichie na umunne ya bunyere ndị ekperima ahụ ọtụtụ ego tupu ha atọhapụ nna ya.

Ụfọdụ akwụkwọ Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Twitter/@ChimamandaReal

Nkọwa foto, Ụfọdụ akwụkwọ Chimamanda Adichie

9. Adịchie nwere nturuugo nkwanye ugwu ọka nkụ

N'ihi ụbụrụ ịchaọkụ ya, nakwa ịdị uchu ya, Adichie enwetala nturuugo dị icheiche.

Ndị a abụghị ndị o nwetara maka ịgụ akwụkwọ, kama ha bụ ndị e ji kwanyere ya ugwu.

Bekee na-akpọ ya "Honorary Degree".

Ọmụmaatụ bụ nke Mahadum Duke dị na obodo Durham na North Carolina, mba Amerịka nyere ya.

Ndị ọzọkwa kwanyeere Adichie ụdị ugwu ahụ gụnyere Mahadu Amerịka (American University), Mahadum nke Yale, nakwa Mahadum Georgetown.

Chimamanda Adichie na Wole Soyinka

Ebe foto si, Instagram/chimamanda_adichie

Nkọwa foto, Chimamanda Adichie na Wole Soyinka

10. Gọọmentị etiti nakwa gọọmentị state kwunyeere Adichie ugwu

N'afọ 2011, gọọmentị Naịjiria tunyere Adichie ugwu ma nye ya nke a kpọrọ "Global Ambassador Achievement Award".

E mechaa, n'afọ 2016, gọọmentị Anambara nyekwara ya nturuugo "Ambassador of Excellence".

Adichie, a mụrụ n'afọ 1977, ga-agba afọ iri anọ na abụọ n'abalị iri na ise nke ọnwa Sepụtemba afọ a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: