HIV/AIDS: Ihe mere asọmmiri ejighi ebufeli nje HIV.

Nwannyị ji akwa ọbara ọbara n'aka.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụbọchị ncheta ọrịa AIDS na mba ụwa n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba na mpekere akwa ọbara ọbara iji gosipụta emume ya.

Ọrịa HIV bụ oke ọrịa gbapụtara ihe n'ụwa nke gburula mmadụ karịrị nde iri atọ na ise dịka ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO).

N'afọ gara aga mmadụ ruru otu nde nwụrụ n'ọrịa HIV n'ụwa gbagburu gburu.

Ihe ruru mmadụ nde iri atọ na asaa bu ọrịa a - pacenti iri asaa n'ime ha si mpaghara Afrịka - ebe mmadụ otu nde na ọma asaa butere ọrịa na 2017.

Ọ bụ naanị site n'ibute nje HIV bụ otu ụzọ mmadụ ga-eji bute ọrịa AIDS.

Kamgbe afọ 1980 ọrịa fesisịrị na mbụ, ọtụtụ akụkọ banyere etu e si ebute ya na etu ọ dị n'ịrịa ọrịa ebutela oke ụjọ n'ime ndị mmadụ.

N'ụbọchị ncheta AIDS, anyị na-akọsasị ụfọdụ akụkọ ndị a gbapụtara ihe n'ime ha.

Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Aga m enwete HIV site n'ịnọkwute onye bu HIV nso

Onye nyocha ahụike nọ n'ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Inyocha ọbara dị mkpa iji chọpụta nje HIV n'ọbara

Nghọtaghe a ebutela ịkpaoke nye ndị bu ọrịa HIV n'oge na-adịla anya.

Agbanyeghi mgbasa ozi megide nke a, n'afọ 2016 pacenti mmadụ iri abụọ na mba UK ka kwenyere na ana-ebufe ọrịa HIV site na mmetụta ahụ maọbụ n'asụ mmiri.

Mana a naghị ebute ya site na mmetụ ahụ, anya mmiri, okpomọkụ, asụ mmiri na mammịrị.

Ị gaghị ebute ya site:

  • Iku otu ikuku
  • Ịmakọ mmadụ. nsusu ọnụ maọbụ ikwe n'aka
  • Ikerikọta ngwa eji eri nri
  • Ikerikọta ngwa eji ebi ndụ
  • Ikerikọta ngwa eji emega ahụ
  • Imetu ngwa ụlọ mposi aka
Na 1991, Adaeze Diana nke Wales zutere onye bu HIV na London iji kọsasịa akụkọ ibufe ọrịa HIV

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Na 1991, Adaeze Diana nke Wales zutere onye bu HIV na London iji kọsasịa akụkọ ibufe ọrịa HIV

A na-ebufe HIV site na mmiri si n'ime ahụ onye bu ọrịa HIV dịka ọbara, mkpụrụ nwa, mmiri si n'ime ahụ nwaanyị na mmiri ara.

Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Ọgwụ ọdịnala ga-agwọli HIV

Nke a abụghị eziokwu. Ịṅụ ọgwụ ọzọ, ịsa ahụ na ngwụcha mmekọrịta maọbụ gị na onye na-amaghị nwoke maọbụ nwaanyị agaghị egbochi ọrịa HIV.

Akụkọ ifo amaghị nwoke 'maọbụ nwaanyị' nke mere na mpaghara Sub-Saharan Afrịka, India and Thaịland, dị ezigbo egwu.

O meela ka a wakpo ụmụaka ụmụnwaanyị n'ike ma tụnye ha ime.

Ngosipụta nje HIV na 3D

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mana a naghị ebute ya site na mmetụ ahụ, anya mmiri, okpomọkụ, asụ mmiri na mammịrị

Maka ekpere nakwa ịtụ aja ime mmụọ nke na-enyere ndị mmadụ aka ịgafe ọnọdụ ọjọọ mana onweghi ihe ọ na-eme n'ahụike onye bu HIV.

Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Anwụnta na-ebusa HIV

Agbanyeghi na ana-ebufe HIV site n'ọbara mana nyocha ekwuola na agaghị ebute ya site n'ụmụ ahụhụ n'amị ọbara, maka ihe abụọ:

1)Ụmụ ahụhụ taa, ha na-amịfe ọbara onye nke mbụ ha tara n'ime ahụ onye nke abụọ.

2) HIV na-adị ndụ naanị n'obere oge n'ime ahụ ndị a.

Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Agaghị enwete HIV ma yiri okpunabuenyi

Okpunabuenyi nwereike ida n'ọrụ igbochi HIV ma ha gbawa, gbụpụ n'oge mmekọrịta nwoke na nwaanyị.

Mgbasa ozi banyere HIV abụghị naanị ka ana-eyi okpunabuenyi mana ka-enyocha ha ahụ maka HIV ma nata ọgwụgwọ maọbụrụ ha bu nje HIV.

Dịka WHO si kwuo, otu onye n'ime mmad anọ ma na ha bu HIV. Nke mere o ji mfe ibufe ya.

Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: HIV enweghi ihe mgbaama

Mmadụ nwereike inwe HIV rue afọ iri maọbụ iri na ise na-egosighi ihe mgbaama ọbụla. Ha nwereike ịhụta obere ahụ esighi ike gụnyere oyi, isi ọwụwa, ọkọ maọbụ ọnya n'izuụka nke mbụ o butere ya.

Onye Nọọsụ na-enyocha ahụ mmadụ maka HIV

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, otu onye n'ime mmadụ anọ ma na ha bu HIV

Ihe mgbaama ndị ọzọ nwereike ịpụta dịka nje a na-ebuso ahụ mmadụ agha: otuto ahụ, ọdịda n'arọ mmadụ, oyi, ọnyụnyụ na ọgbụgbọ.

Ọ bụrụ na-agwọghị nke a, onwereike ibute oke ọrịa ndị dịka ụkwaranta, 'cryptococcal meningitis' nakwa nje baterịa dị iche iche na kansa ndị dịka 'lymphomas na Kaposi's sarcoma' na ndị ọzọ.

Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Ndị bụ nje HIV ga-anwụ n'oge.

Onye ọbụla ma na ya bu nje HIV ma nata ọkwụkwọ ka okwesiri ga-ebi ndị nke ọma.

UNAids kwuru na HIV na-ezo n'obara n'ọnụọgụ mmadụ ruru pesenti 47 bụ ndị bu ya bụ nje nke bụ na-agaghị ahụ ya ma achọwa ya

Ndị HIV zoro n'obara agaghị ebufeli ya onye enweghị ya bụ nje ma ha nwee mmekọ.

Nwa na nne

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị nje HIV zoro n'ọbara ha nwere ike ụmụ nwa n'ebufeghị ya nwa ha

Agbanyeghị, ọ bụrụ na ha kwụsị ịṅụ ọgwụ ha, ya bụ nje nwere ike ịgosiputakwa ọzo n'ụle.

Dịka WHO kwụrụ, ọnụọgụ mmadụ ruru nde iri abụọ na otu (21.1) bụ ndị bu ya bụ nje HIV natara ọgwụgwụ n'afọ 2017. Nke a karịrị mmadụ nde asatọ bụ ndị natara ya bụ ọgwụgwọ n'afọ 2010, ya bụ pesenti 78 bụ ndị ma na ha bu ya bụ nje.

Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu:: Nne bu HIV ga-efelata ya nwa ya

Nke abụchaghị eziokwu. Nne nje HIV zoro n'ọbara ya nwere ike ịmụ nwa na-ebufeghị ya nwa ya.

Akụkọ ga-amasi gị