Ihe ise ị na-amaghị maka George H W Bush nke nnukwu

Ebe foto si, Reuters
Aka chiburu mba America anwụọla bụ George Herbert Walker Bush anwụọla n'afọ iri itoolu na anọ .
Ọ bụ nwa ya nwoke George W Bush kwuputere nke a .
George Bush Sr, dịka aha eji mara ya nwụrụ n'ụbọchị Nọvemba 30 n'elekere iri nke abalị dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị be ha si kwu.
Bush chịrị Amerịka site n'afọ 1989 ruo afọ 1993 ma chịkwa ugboro abụọ dịka osote onyeisiala Amerịka bụ Ronald Reagan.
N'ọnwa Aprelụ, akpọgara ya ụlọ ọgwụ maka ọrịa metụtara ọbara ya mana o mechara nwete ọgwụgwọ laghachi bee ya.
Bush onye bụ onyeisiala mba Amerịka nke iri anọ n'otu nwụrụ ka ọ gafechara ọnwa asaa nwunye ya Barbara ji nwụ.
Ihe ndị ọzọ eji mara Bush nnukwu bụ :
- Ọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị dịka onye otu pati Repụblịkan n'afọ 1964.
- Ọ bụ onyeisiala nke iri anọ na otu chiburu mba Amerịka
- O rụkwara n'ụlọ omeiwu mba Amerịka , rụọ dịka onyeisi CIA nakwa onye nnọchịanya obodo China.
- O nweteghị oche onyeisiala mgbe ya na Bill Clinton zọrọ ya na ntụliaka afọ ahụ.
- George nwere ụmụ ise na ụmụ ụmụ iri na asaa tupu ọnwụọ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ndụ o biri.
Onye na-achị mba America ugbua bụ Donald Trump etoola ndụ Bush nnukwu biri kwuo na ọ na-eme mma karịa etu esi tụanya mgbe ọ dị ndụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Bill Clinton so kwa chị Amerịka n'oge gara aga kwukwara na ya ga-enwere ọyị ya Bush nnukwu dịka ihe nrite ọkachasị nweta na ndụ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:









