America: Ihe mere Obodo ahụ anaghị enye visa n'Abuja ugbua

Ebe foto si, Getty Images
Onyeọbụla na-aga njem na mba Amerika anaghị enwe ike ị nweta akwụkwọ ikike ị bata ala ahụ ugbua n'Abuja makana ha emechiela ụlọọrụ na-ahụ maka ya.
Onye ntaakụkọ BBC nọọ n'Abuja zitere ozi na ọtụtụ ndị mmadụ kwụụ n'iro, n'eche ka ha gbọbata ha, gbara aka laa makana onweghị onye biara ọrụ taa n'ụlọọrụ ahụ.
Ụlọọrụ a akpọrọ "US embassy consolate" dị na Naịjirịa na Bekee dere akwụkwọ ozi na websait ha, ka onye ọbụla na-achọ akwụkwọ ikike ị ga njem n'ala Amerika gawa Legos maka ị nata yabụ akwụkwọ.
Ha kwuru na mmechi a ga-abụ nwantịtị ụbọchị mana ha ekwubeghi oge ha ga-emepe.
Ha kwukwara na ha-zipuru ozi a n'igweozi' nke bekee kpọrọ 'email' maka mkpebi a ha mere.

Ebe foto si, Getty Images
Mana ọtụtụ ndị mmadụ onye ntaakụkọ BBC gbara ajụjụ ọnụ taa na Abuja kọwara na onweghị ozi ọbula ha nwetere maka mkpebi a.
Otu n'ime ndị a achọghị ka anyị kpọ aha ya gwara BBC na ya sị Legos bịa Abuja maka akwụkwọ ikike a.
O kwuru na: "Ihe kachasị ewute m bụ na ekpofuru m ego n'ụlọ oriri, cheta kwa na ahụhụ di ugbua na Naịjirịa onye were udi ego a? Gịnị mere ha ezipughi akwụkwọ ozi a n'oge?"
O kwukwara na ọtụtụ ndị biara ụlọọrụ a taa sị Akwa-Ibom, Kano, Calabar nakwa ọtụtụ ebe tere aka n'ala Naijirịa.
Otu nwa agbọghọ kwuru na mkpebi a ga-emebi ọtụtụ ihe na akwụkwọ ya makana echi ka ụlọakwụkwọ ya ga-emepe n'Amerika.
Ọ na-ebe akwa na ọ maghị ihe ọ ga-eme ugbua.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









