2019 Africa Cup of Nations: Cameroon agaghị ahazi ya

Ebe foto si, AHMED OUOBA/AFP/Getty Images
Confederation of African Football (Caf) ekwuola na Kamerun agaghị abụzị obodo ga-ahazi asọmpi ahụ nke afọ a.
Caf sị na ha napụrụ Kamerun nhazi a maka oge ha na-egbu na nkwado asọmpị a ga-ebido n'ọnwa Juun nke afọ 2019.
Ndị na-achị Caf nwere nkwekọrịta a na nzukọ ha mere n'isi obodo Gana bụ Accra.
Onyeisi Caf bụ Ahmad Ahmad sị ha ha ga-agba mbọ "inweta mba ọzọ ga-ahazi asọmpi a tupu afọ a agwụ".
Mba Afịrịka 24 ga-eso n'asọmpi a ga-ebido n'ọnwa Juun na Julaị.
Ahmad kwuru n'ime afọ 2017 na Kamerun ka kwesịrị "ime ka Caf kwere na ha nwere ikike" ihazi asọmpi a, ka mba ahụ na-ekwu na ha zuru ka e mee.
Mana n'ime Ọgọst 2018, Amaju Pinnick, bụ onyeisioche ngalaba nhazi na Caf sị, "onweghi onye ga-anapụ Kamerun asọmpi a".
E kwuburu na ọ ga-abụ mba Moroko ka a ga-enwe nhazi a, site etu ha si pụta hazie nke afọ mgbe a napụrụ ya Kenya n'aka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











