Nigeria vs South Africa: Super Eagles ga-eso agba "Iko mba Afrịka"

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa

N'egwuregwu,

Ndị Super Eagles

Ebe foto si, Getty Images

Naịjirịa agafeela ma sonye na ndị ga-agba Iko mba Afrịka nke 2019 ka ha na Saụt Afrịka ji otu goolu gbaa onye laba onye laba.

Ebe Libya ha na Naịjirịa nọ n'ime otu Otu E ahụ, ji ọkpụ goolu asatọ a satara naanị otu nyụọ ndị Seychelles anya.

Onye ọkachamara n'egwu bọọlụ aha ya bụ Ejike Kanife, kọwara ihe "onye laba onye laba" a pụtara.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

O kwuru na 1-1 Naịjirịa na Saụt Afrịka gbara mere ka Naịjirịa nọrọ n'elu tebulu otu E, ma mekwaa ka ha gafee n'ịgba asọmpi Iko Mba Afrịka 2019.

O kwukwara na Naịjirịa gbara ọfụma n'egwuregwu a, ma kwuo na goolu abụọ Naịjirịa nyere nke onye ogbu pịpịrọ gufuru, kwesịrị ịbụ goolu.

Libya ka nwere ohere igafe maọbụrụ na na ha jiri ọtụtụ goolu merie Saụt Afrịka mgbe ha ga-ezute ọzọ.

Makana mmeri ahụ ga-eme ka Libya nwere pọintị asaa ugbua ga-eji otu pọịntị gafee Saụt Afrịka nwere pọịntị itoolu.

Cheta na Naịjirịa esoghị gbaa nke afọ 2015 makana ha akpataghị ike ha ga-eji eso ndị gafere.

Ntuliaka 2019

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec ekwuola na ha ga-ebuli iwu machiri ịgagharị n'obodo maka nkwado ịzọ ọchịchị nke 2019.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Nke bụ na bido n'ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa a, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwereike ibido ihe Bekee kpọrọ "Campaign".

Ihe Saraki kwuru maka Zik

Onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki, butere ụkpa otuto nye Odogwu ndị Igbo bụ Nnamdi Azikiwe n'emume e mere iji cheta ya n'Ọka.

Saraki kwuru na Zik mere ọtụtụ ihe ọma e ji echeta ya, na ọ bụ onye anaghị akpa oke ma bụrụ ọkụ nye ndị agbụrụ isi ojii.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Na mba ofesi,

Otu onye anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ ka ndị mmadụ pụtara ime ngagharịiwe na mba Frans.

Ndị mere ngagharịiwe

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị mere ngagharịiwe

Iwe ndị a bụ na ego mmanụ ụgbọala ejirila pasentị iri abụọ na atọ rịgo elu karịa ihe ọ nọbu, n'ime otu afọ.

Gọọmenti enyela ego enyemaka n'ịku osikapa

Osikapa

Ebe foto si, Getty Images

Gọmenti etiti ekwuola na ha ga-etinye ego ruru ijeri naira 60 dịka ego eyemaka n'ịkụ osikapa na Naịjirịa.

Minista na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ Audu Ogbe kwuru na mkpebi a bụ maka ị hụ na egọ eji azụ osikapa gbadata n'ahịa.

"APC bụ ụlọ mpu"

Christian Association of Nigeria

Ebe foto si, Getty Images

Otu ụka Christ na Naịjirịa bụ Christian Association of Nigeria agwaala onyeisiala Muhammadu Buhari na patị ya bụ APC aburula ụlọ ebe ndị mpu na aghụghọ na-ezo .

CAN gwara Buhari na oge eruola ị buso ndị niile na-etinye aka na mpu na aghụghọ agha n'ezie agbanyeghị onye ha bụ n'ala Naịjirịa.

Abaribe

Abaribe

Ebe foto si, Getty Images

Sinatọ Enyinnaya Abaribe agwala gọmentị etiti ka ha gba mbọ hụ na a nwere ọgbakọ ga- akwalite udo na Naịjirịa.

Abaribe gwara ndị nta akụkọ na ọ bụ sọọsọ gọmentị nwere ike ị hụ na udo laghachịtere az ụ n'etiti otu okwukwe n'obodo dị iche iche na Naịjirịa.

Ụbọchị ezumike

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị etiti ekwuola na ụbọchị tusde bụ ụbọchị iri abụọ n'ime ọnwa ga-abụ ụbọchị ezumike.

Mkpebi a bụ ka ndị ụka alokoba nwere usoro ha ga-ji me mme mme ha bụ Eid-el Maulud.

Ọkụ Kalifonia

California fire

Ebe foto si, Getty Images

N'ofesi, ndị gbatagbata na-ekwu na ha ka na-achọ mmadụ ruru otu puku n'obodo Kalifonia ebe nnukwu ọkụ gbara ọtụtụ ụlọ nakwa gbuo mmadụ ruru iri asa na otu.

N'egwuregwu,

Super eagles

Ebe foto si, Getty Images

Otu Super Eagles na mba Saut Afrịka ga-asụkọta mpi taa n'asọmpi ga-ahọpụta ndị ga-eso n'asọmpi iko mpaghara Afrịka n'afọ 2019.

Super Eagles na ndị Bafana Bafana ga-ezute taa n'elekere abụọ nke ehihie.

Gee nkeji ụtụtụ a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo, Di na nwunye mụrụ ejima atọ