Nigeria vs Libya: Super Eagles bụzị ndị isi Group E

Ebe foto si, AFP
Naịjirịa abụrụla ndị nọ n'isi Group E n'asompi eji amara ndị ga-etozu ịga iko mba Afịrịka nke Bekee kpọrọ African Cup of Nations nke 2019.
Nke mere kaotu bọọlụ Super Eagles ji ọkpụ atọ asatara abụọ merie Libya n'asompi agbara na Tunisia taa.
Ndị nọ bụ n'isi Group E bụ South Afrịka na ogbo ha bụ Seychelles gbara nhatanha na ọdọ egwuregwu Linite dị na Victoria.
Bafana Bafana jiburu 6-0 gbaka Seychelles ahụ na-agba nke mbụ ha.
Naịjirịa ji ọkpụ atọ asataghi merie Libya na-agba nke mbu ha na Naijirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:







