Otele ukwu egbuola nwaanyị ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Nwanyị ọzọ sị mba Britain anwụọla ebe ọ gara ụlọọgwụ makana ọ chọrọ ukwu sara mbara.
Akụkọ kọwara na nwaanyị a nwụrụ oge ọ gara ịnata atụmatụ ahụike nke akpọrọ "Brazilian butt lift" na Bekee.
Cheta n'ime ọnwa Ọgọst nke afọ a, otu nwanyị aha ya bụ Leah Cambridge nwụrụ na mba Tọkị ebe ọ gara ịnata asambala ukwu.
Ike m bidoro ihi ehi
Otu nwanyi ọzọ dị afọ 23 gwara onye ntaakụkọ BBC na ike ya bidoro ihi ehi mgbe ọnwa atọ gachara ka mgbe ọ gara ịnata otele ukwu a.

Ebe foto si, Getty Images
'Ike m tupuru atupu nke mere na iga ije na-ahịa ahụ, ahụ m niile bidoro ishi nnukwu ishi"
Onye ọzọ gwara BBC na iba banyere ya n'ahụ oge ọ lata ukwu a, nakwa na mgbe niile ya kpọrọ ụlọọgwụ a maka nyemaka, onweghi onye buru ekwenti ya ọzọ.
"Kwụsị nụ emume a"
Ndị dibia Bekee ji ohere a eti mkpu ka ụmụnwanyị kwụsị ịnata atụmatụ ahuike a.
Ngalaba kpọrọ onweha"British Association of Aesthetic Plastic Surgeons" kwuru na ọ bụ ya bụ usoro kachasị eri ndụ mmadụ.
Ndị dọkịnta kọwara na ha na-agbanya abụba n'ime ike onye ahụ chọrọ ukwu sara mbara.
Mana ụfọdụ oge ha ga-agbanye abụba n'ime akwara na-ebu ọbara gawa ụbụrụ maọbụ mkpuruobi na amaghị ama.
Nke a na-ebute ọnwu.
Akụkọ ga-amasị gị










