Ebubo Nwakpo: Ronaldo agaghị eso n'asọmpị Poland na Scotland

Ebe foto si, Getty Images
Ebubo nwakpo ka dị n'ishi onye ọgba bọọlụ ama ama bụ Christiano Ronaldo.
Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na Ronaldo agaghị eso n'ime ndị otu Portugal ga-asọ otu Scotland mpi n'ime ọnwa.
Mana onye na-achịkọta otu a bụ Fernando Santos ekwughị ma ihe a bụ ihe mere etinyeghị aha Ronaldo n'ime ndị ga-asompị a.
Ihe Santos kwuru bụ na ohere ga-apụta n'ihu ebe Ronaldo ga-enwe ike ịnye ndị otu ya aka.

Ebe foto si, Matrix
N'ụbochị Oktoba 2 nke afọ a, ndị ụweojii n'Amerika kwuru na emeperiala ọzọ ikpe a na-elebe anya n'ebubo nwakpo otu nwanyị aha ya bụ Kathryn Mayorga boro Ronaldo.
Mana n'ime ozi Ronaldo dere na twitter, ọ ka na-ekwusike na aka ya dị ọcha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Kathryn Mayorga, n'ime ebubo ahụ, kwuru na o zutere Ronaldo na Rain Nightclub, nakwa na Ronaldo wakporo ya n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ akpọrọ "Palms Hotel and Casino."
Ọkaiwu ya bụ Leslie Stovall kwuru na Kathryn Mayorga anwala igbu onwe ya ọtụtụ oge n'oge garaaga maka ihe a mere ya.
Ndị uweojii na-ekwu na ha na-eleba anya na yabụ ebubo ugbua.
Akụkọ ga-amasị gị