Jos: Ndị isiekweọnwụ egbuola mmadụ 13

Ebe foto si, Chuwang Dalyop
Isi mmadụ 13 abanyela n'ọgbaghara dapụtara ọhụrụ na Riyom, okpuru ọchịchị nke Nọt-Sentral nke Platu Steeti.
Emmanuel Danboyi Jugu bụ onyeisi ndị Kọmitii na ahazi ihe kwuru na ha elielarị mmadụ iri nke gụnyere ụmụaka na ụmụnwaanyị.
Ụnyahụ ka ndị Mahadum nke Jọs kwuru na ha achọtala onye ahụ a na-achọchọ kemgbe ọgụ nke ikpeazụ a bidochere ebe ahụ.
O doghị anya mgbe tigbuo zọgbụo a gaa-ebe na Plateau mana ihe dooro anay bụ na ndị obodo na ndị ọrụ nchekwa esighi otu ụzọ agafe bụ nke were ike ịnye aka belata ya bụ ọgbaaghara.

Major-General Augustine Agundu bụ onye nọchitere anya chief Lt-Gen Tukur Buratai mgbe eliri ndị agha atọ nwụrụ na Septemba na Barkin Ladi kwuru na ọ dịka ọ bụ ndị Eze obodo so akwanye ọkụ na ya bụ ọgụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mathias Terna Tyopev sị na ha enwetachabeghị nke bụ ezi okwu na ya bụ mkpamkpa nke kpara nsonso a bụ nke metutere ndị Berom bi na Riyom.
Mazi Jugu kwuru na achọpụtala ozo mmadụ atọ ọzọ nwuru na ọgbaaghara ahụ.






