Bubonic Plague: Ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa a

Ihe ọrịa bubonic plague e wepụtara n'ahụ onye rịara ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe ọrịa bubonic plague e wepụtara n'ahụ onye rịara ya

Ndị ọrụahụike mba Chaịna etinyela usoro e ji egbochi ọrịa a na-akpọ "Bubonic Plague" dịka otu onye buterela ya na mpaghara Mongolia.

Dịka akụkọ si na mba ahụ pụta si kwuo, onye a chọtara ya bụ ọrịa n'ahụ ya ugbua bụ onye na-achị anụmanụ n'obodo Bayannur.

Ha kwuru na e tinyela nwoke ahụ butere ya na ndopu iji gbochie mfesa ya bụ ọrịa.

Ọrịa a selitere isi ugbua na mba Chaịna abụghị mbụ ụwa na-anụ maka ya, mana gịnị ka ị kwesịrị ịma maka ya?

Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya bụ ọrịa

  • N'ihi etu o si gbuo ọtụtụ mmadụ site n'afọ 1346 ruo 1353, a kpọrọ ya "Black death"
  • "Black Death gburu mmadụ nde iri ise (50 million) n'Afrịka, Asia nakwa Yurop
  • N'afọ 1665 ọrịa a bara obodo Lọndọn ma gbuo ọkankụ mmadụ
  • Ọ banyekwere mpaghara Chaịna na India ka afọ nari atọ na ụma gachara were gbuo mmadụ ihe karịrị mmadụ nde iri na abụọ (12 million).
Praire dog

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụdịrị anụmanụ a bụ ya na-ekesa bubonic plague

Ihe na-ekesa ọrịa a

A na-echebu na ọ bụ oke na-ekesa ọrịa bubonic plague mana nchọpụta na-egosi na ọ bụ akpịrị na-esi n'ahụ ụmụ anụmanụ ebunye ya ndị mmadụ.

Ya bụrụ na akpịrị taa onye bu ya ma taa onye ọzọ ọ ga-ebunye ya onye ahụ.

Etu ọzọ bu mmadụ rie anụ si n'anụmanụ bu ọrịa a.

Esikwa ikuru ume ikuku ọrịa dị n'ime ya ebute ya.

Kedụ ama ya?

Ihe na-egosi n'ahụ onye bu ọrịa bụ:

  • Ahụ ọkụ
  • Ọrụrụ agbọ
  • Ike ọgwụgwụ
  • Oyi
  • Ọzịza olu na mkpa abụ.

Ọrịa a ọ ka na-egbu mmadụ?

Ọrịa a naghizi enye ụdịrị nsogbu ọ na-enye mgbe gboo mana ọ na-adapụta ụfọdụ oge.

N'afọ 2017 ọ sepụtere isi na mba Madagaska ka o fesara madụ 300. Mmadụ 30 n'ime ndị a nwụrụ, dịka akwụkwọ ntaakụkọ banyere ahụike a kpọrọ Lancet siri kwuo.

Nnyocha e mere n'ọnwa Ọktoba nke afọ 2015 gosiri na mmadụ 15 buterela ya bu ọrịa na mba Amerịka n'afọ ahụ.

N'ọnwa Mee n'afọ gara aga mmadụ abụọ nwụrụ na mba Mongolia site n'ọrịa a.

Ha butere ya ka ha richara anụ oke a na-akpọ marmot n'oyioyi.

A na-echekwa na onye bu ya ugbu a richara ụdịrị anụ ahụ.

Nke bụ eziokwu bụ na ọgwụ Bekee na-akpọ antibiotics na-ere n'ịgwọ ọrịa a, nke a mere ka ọkankụ ndị ọ na-egbu na-agbake.

Kedụ etụ esi egbochi ọrịa?

Bubonic plague enweghi ọgwụ mgbochi.

Ọ dị mkpa ka onye ọbụla gbaa mbọ dewe mbara ya ọcha iji gbochie ya.

Lee ụsọrọ mgbochi a ebe a:

  • Fachie ebe ọbụla oke maọbụ ụmụ anụmanụ nwereike si bata na be gị
  • Gbaa mbọ hụ na ụmụ anụmanụ enweghị ebe ha ga-eji mee ụlọ na be gị
  • Jiri ihe eji egbu ekpịrị ma ị na-aba ọhịa, ọkachasị ma ha bụrụ na ọrịa a na-ewu.
  • Kado anya ma ị na-emetụ anụmanụ aka, ma ha adị ndụ ma ha anwụrụ anwụ.
  • Gbaa anụmanụ bi be gị ọgwụ akpịrị
  • Ekwela ka anụmanụ na-akpagharị n'ezi dinaa n'elu akwa gị.