Men's Health: Ọrịa isii kacha emetụ ụmụnwoke karịa ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ndị Igbo na-ekwu okwu sị na mmadụ na ibe ya ha bụ n'ọnụ, maka n'ezie, mmadụ niile abụghị otu.
N'otu aka ahụ, nwoke na nwaanyị abụghị otu, ya kpatara na ọrịa ụfọdụ ka emetụta ụmụnwoke karịa ndị nwaanyị.
Oge niile ka ndị ọkachamara na ndị ọkammụta sayensị na-esi imi n'ala ịchọpụta ihe na-akpata ọrịa, mana ọtụtụ n'ime ha ekwekọrịtala na ụfọdụ ọrịa na-abịara mmadụ n'ihi na onye ahụ bụ nwoke maọbụ nwaanyị.
Akụkọ a ga-agbado ụkwụ n'ọrịa ndị kacha emetụta nwoke karịa nwaanyị.
Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a:
1) Ọrịa Agede (Prostate ailments)

Ebe foto si, Getty Images
Nwoke ọbụla katawarala ahụ kwesịrị ịga mee nnyocha mara ma agede ya akwụkwa chịm.
Agede bụ akụkụ ahụ nke Bekee kpọrọ 'prostate'.
Ọ bụ mkpụrụ dị n'etiti amụ na akpa mamịrị. Akwara si akpa mamịrị gafere n'ime ya.
Ọrụ agede, dịka ndị ọkammụta sayensị siri dee bụ imepụta mmiri na-enye miri utu aka.
Ọrịa na-emetụta agede nwoke gụnyere: Okuko Agede (Prostatis), Agede itofe oke (Prostate Hypertrophy) na Akpụ Agede (prostate cancer).
Ọ bụ ịṅụ ọgwụ maọbụ ịwa ahụ ka e ji agwọ ọrịa ndị a.
Ọ na-adịkwa mma ma onye bu ọrịa a chọpụta ya n'oge, ka o nwee ike malite ịnata ọgwụgwọ ọsịsọ.
2) Okwute akpa mamịrị (Bladder stones)

Nke a bụ mgbe ihe dịka kịrịkịrị okwute malitere ịpụta n'akpa mamịrị mmadụ.
Ihe na-akpata nke a bụ mgbe ihe na-emepụta mamịrị gbakọrọ ọnụ ma kpọọ nkụ n'ime ahụ mmadụ.
Nnyocha gosiri na ọrịa a karịrị n'ụmụnwoke karịa ụmụnwaanyị.
Ndị ọkachamara kwukwara na ọrịa a na-aka njọ ma nwoke katawa ahụ, ihe dịka malite n'afọ iri ise gbagowe.
A na-eji ịwa ahụ nke "Transurethral cystolitholapaxy" bụ otu usoro n'ime ya were agwọ ya.
Mana ndị ọkachamara na-adụkwa ọdụ ka onye bu ọrịa a na-aṅụ mmiri iji kpochapụta ya.
3) Ọrịa akpụ (Cancer)
E wepụ ọrịa akpụ nke ara bụ 'breast cancer' na Bekee, nnyocha gosiri na ọ bụ ụmụnwoke ka ọrịa akpụ ndị ọzọ kacha emetụta.
Ndị a gụnyere ọrịa akpụ nke ọnụ (oral cavity cancer), ọrịa akpụ nke mgbịrịafọ (colon cancer), ọrịa akpụ nke akịrị (kidney cancer), dgz.
Ndị ọkammụta sayensị na-ekwu na nke a nwere ike ịbụ maka na ọ bụ ụmụnwoke na-emekarị ihe nwere ike ịkpata ụdị ọrịa ndị a, dịka ise anwụrụ nakwa ịṅụ mmanya na-aba n'anya.
Otu ụzọ a na-ejikarị agwọ ọrịa ndị a bụ site n'iwa ahụ.
4) Ọrịa Pakịnsịn (Parkinson's Disease)

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa pakịnsọn bụ mgbe ike malitere ịgwụ ụbụrụ mmadụ ma onye ahụ kawa nka na-akpata ya.
Ọ bụ ma mmadụ kawa nka ka ya bụ ọrịa na-apụtakarị ihe.
Otu ihe e ji ama ya bụ aka ịma mmadụ jijiji n'ihi na ike agwụla njikọ ọkpụkpụ nakwa anụahụ.
Ndị nnyocha kwuru na ọrịa a ka njọ na nwoke karịa na nwaanyị.
Muhammad Ali bụ ọpịa ọkpọ bụ otu onye a ma ama rịara ọrịa a tupu ọ nwụọ.
Ruo ugbua ọrịa a enwebeghi ngwọta, mana a na-enye ndị mmadụ ọgwụgwọ na-enyere ha aka ibi ndụ ha, site n'ịṅụ ụfọdụ ọgwụ nakwa ịwa ahụ nakwa nke Bekee kpọrọ "physiotherapy".
5) Mkpọnwụ ahụ (Stroke)
Ọ bụrụ na ọbara anaghị eru n'ụbụrụ mmadụ nke ọma, o nwere ike ime ka 'cell' dị n'ụbụrụ nwụọ.
Nke a mee, o nwere ike ime ka otu akụkụ ahụ mmadụ maọbụ nke ọzọ kpọnwụọ.
Ihe na-akpata mkpọnwụ ahụ gụnyere oke ise anwụrụ, oke ibu, ọrịa shuga, ọke mmanya na-aba n'anya, anaghị emegharị ahụ, dgz.
Nnyocha gosiri na ụmụnwoke ka enwe ọrịa mkpọnwụ ahụ karịa ụmụnwaanyị.
Mana ọrịa a ka emesi ụmụnwaanyị ike ma o mee ha karịa ụmụnwoke.
6) Ọrịa obi (Heart disease)

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa obi nke kacha emetụta ụmụnwoke bụ nke a kpọrọ 'coronary heart disease' na Bekee.
Ihe na-akpata ya bụ mgbe ọbara anaghị erucha n'obi mmadụ otu o kwesịrị.
Ọtụtụ ihe na-akpata mkpọnwụ ahụ (stroke) bụkwa ha na-akpata ọrịa obi.
Nnyocha gosiri na ọrịa obi na-aka ejitu ụmụnwoke karịa ndị nwaanyị.
Ụzọ kacha mfe e si agwọta ọrịa obi bụ ma a chọpụta ya n'oge.
Ya kpatara ime nnyocha kwa mgbe kwa mgbe ji dị ezigbo mkpa.
Ọrịa atụghị nwaanyị ime

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa ọzọkwa na-emetụ ụmụnwoke enweghị ike ịtụwa nwaanyị ime.
Nchọpụta gosiri na ọrịa a na-agbali elu ugbua n'ime ụmụnwoke.
O nwere ọrịa dị icheiche nwere ike igbochi nwoke ịtụwa nwaanyị ime.
Nke mbụ bụ mmechi mpio ebe ughe si apụta (sperm blockage), nke abụọ bụ ụghe anaghị agbazu agbazu (low sperm production), nakwa ughe anaghị akpa agwa etu o kwesịrị (abnormal sperm function).
Ise anwụrụ, ịṅụ ọgwụ ike, ịṅụ oke mmanya, ibu oke ibu, dịrị gawazie, socha na ihe nwere ike ịkpata ụdị ọnọdụ a.
Ihe ndị a nwere ọgwụgwọ ma a malite n'oge lebanye ya anya.
Mana nke a abụghị ihe mmadụ ga-eji aka ya mee.
Onye nwere ụdị ọrịa a kwesịrị ịga ụlọọgwụ ka dọkịta nyere ya aka.












