Prostate Health: Etu ị ga-eme ka 'prostrate' gị na-achị sọ ọchị

Dọkịta ji ihe eji enyocha ahụ

Ebe foto si, Eyewire Inc

Otu ọrịa na-amapụ ụmụnwoke obi bụ Kansa na-eme agede bụ mkpụrụ dị n'ime ahu nwoke Bekee na-akpọ "prostate".

Agede bụ mkpụrụ di n'etiti amụ na akpa mamịrị. Akwara si akpa mamịrị gafere n'ime ya.

Ọrụ agede, dịka ndị ọkammụta sayensị siri dee bụ imepụta mmiri na-enye miri utu aka.

Ọ na-abụ nwoke nyụọ mmiri utu, agede agbanye ya mmiri nke a.

Ya bu ọrụ ya dị mkpa n'usoro ịmụ nwa.

Ọrịa na-efesa agede

Prostate

Ebe foto si, Getty Images

Prostatitis: Agede na-eko oge ụfọdụ. a na-akpọ ya "Prostatitis" na Bekee. O nwere ike ịbụ nje na-ebute ọnọdụ a. Ọ bụ ọgwu a kpọrọ "antibiotics" ka a na-eji agwo ya.

Prostate Hypertrophy: Agege tofere oke na-emekwa oge ụfọdụ. Bekee na-akpọ ya "prostate hypertrophy" maọbụ BPH. Ihe na-eme ụmụnwoke niile gafere afọ 50. Ọ na-eme ka ịṅyụ mamịri na-arịa ahụ. E ji ọgwụ na ịwa ahụ agwọ ya.

Prostate Cancer: Kansa Agede bụ ụdịrị kansa na-emekarị ụmụnwoke mana sọsọ otu n'ime ụmụnwoke 41 na-anwụ site na ya. Ịwa ahụ, iji ọgwụ gbuo izi (nke Bekee na-akpọ "chemoteraphy") na usoro Bekee kpọrọ radiation agwọ kansa agede.

Ihe ị ga-eme agede gi na-enwe aṅụrị

1: Gaa mee nyocha

Man in medical appointment

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụnwoke ruru afọ 40 kwesiri ime nyocha maka kansa agede

N'ọnwa janụwarị 2020, BBC dere na ọ bụ kansa agede bụ nke a kachasị ahụ n'ahụ mmadụ n'obodo Eliza.

Mana ngalaba a kpọrọ "Public Health England" kwuru na ihe kpatara nke a bụ makana ọtụtụ ụmụnwoke na-agazi ime nyocha.

Dịka anyị kwuru mbụ, otu ihe dị mkpa ime bu iga mee nyocha mata ma ha e bu kansa agede.

2: Rie ezigbote nri

Experts advise eating a wide range of fruit and vegetables

Ebe foto si, Thinkstock

Nkọwa foto, Experts advise eating a wide range of fruit and vegetables

Ọtụtụ mmadụ amaghị mkpa nri dị, ọkachasị nri nwere ihe niile e kwesiri inwe maka inye ndụ ahụ.

Ndị ọkachamara na-ekwu na tomato, agwa, azụ na ndi ọzọ na-adị mma maka ahụike agede.

Ya bụ, rie nri nwere ihe Bekee na-akpọ "balanced diet".

Agbanyeghị ihe ndị a edepụtara, dọkịta Bekee aha ya bụ Mcginger Ibeneme gwara BBC na o nwechaghi ihe e ji egbochi ya karịrị ime nyocha n'oge.

Dọkịta Ibeneme sịkwa na o nwere ndị dọkịta na-asị na nwoke na-eme mmekọrịta nwoke na nwaanyi kwa mgbe anaghị enwetakarị nsogbu agede, mana ọ sị na ọtụtụ ndi dọkịta ekwebeghi na nke ahu bụ eziokwu.

Aha onyonyo, 'Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozigbo m nụrụ ihe na-eme, aganwụzịghị m ije'