Coronavirus in Nigeria: 'Ọ bụghị coronavirus gburu Kọmịshọna Mbara Ezi' - Gọọmentị Abia steeti

Solomon Ogunji

Ebe foto si, Dr Solomon Ogunji/Facebook

Kọmịshọna maka mgbasa ozi nke Abia steeti bụ John Okiyi ekwuola na Kọmịshọna na-ahu maka mbara ezi n'Abia steeti bụ Solomon Ogunji anwụọla.

O kwuru na ọ bụ n'ụbọchị satụde nke iri abụọ na atọ nke ọnwa Mee ka ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ mahadum Abia steeti.

Solomon Ogunji rụkwara ọrụ dịka onyeisioche ngalaba gọọmentị Abia steeti hiwere maka ọrịa coronavirus.

Solomon Ogunji

Ebe foto si, Dr Solomon Ogunji/ Facebook

N'otu aka ahụ, onyeisi odee akwụkwọ nke Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka kọwara na ọbụghị coronavirus gburu ya kama na ọ bụ site n'ọrịa ọbara mgbalị ka o siri nwụo.

Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu natara ya bụ ozi n'obi nnwute dịka ọ bụ nanị n'ụbọchị Wenesde ka Ikpeazu na Ogunji nwere nzụkọ.

Ikpeazu e zịgarala ndị ezinụlo ya ozi iti aka n'obi.

A na-eke onye enyemaka Boris Johnson nnukwu ọkpọ ugbua ka o rituo n'okwa

Onye ụlọomeiwu "conservative" nke mba UK akpọọla oku ka onye enyemaka Boris Johnson rituo n'ọkwa ya.

Steve Baker kwuru ka David Cummings rituo makana ọ gara njem mgbe mba ahụ a machịrị ngagharị maka covid 19 na Uk.

Ka Baker kwuchara nke a n'ihe ngosi BBC, ndị otu ya dịka Simon Hoare nakwa Damian Collins tinyere ọnụ kwuo ka Cummings kwakọrọ lawa makana ọ chịpụtala ụkwụ gọọmenti mba Uk n'ezi.

Kedụ mgbe nsogbu Cummings malitere?

N'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Maachi ka ozi pụtara na Downing na Boris Jonhson nakwa minista na-ahụ maka ahụike nke Uk butere coronavirus.

A hụrụ ebe mgbe cummings si n'ụlọ praim minista Uk agbapụta ụbọchị ahụ.

N'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Maachi, ozi pụtakwara ebe ahụ na Cumming dopuru onwe ya n'ụlọ ya ka o bidoro hụwa ihe gosiri na o bu coronavirus.

Cumming na ndị bee ya gụnyere nwunye and na nwa ya gara njem site na Lonmdon ruo na Durham ị ga-anọ ndopu ha. A mabeghị ụbọchị bụ ihe ahụ.

Ụlọọrụ na-agụkọ ndị batara na mba ha na Durham kwtere na Cumming batara n'ụbọchị Maachi iri atọ na otu.

Kedụ iwu coronavirus Cummings dara?

Mgbe Cumming mere njem ahụ, UK niile nọ mmachị ngagharị nke gụnyere ihe ndị a.

·Ị ga-apụ ga-azụtanwu naanị ọgwụ na nri

·Ị ga-aganwu ga mee mmegharị ahụ naanị gị maọbụ gị na ụfọdụ ndị bee gị.

·Ị ga-apụli ga-anata ọgwụgwọ

·Ị ga-apụlị maka ọrụ dị oke mkpa

. ị gaghị aganwu bee ọyị maọbụ ụmụnne gị maọbụrụ na ihu ihe ọbụla gosiri na i bu coronavirus.

. Ị ga-edopu onwe gị ruo abali iri na anọ ma ihu ihe gosiri na ibu ọrịa covid.

Gịnị ka Cummings kwuru maka ya bụ atụmmatụ?

O kwuru na onweghị ihe ọjọ o mere nke o ji enwe iwu ọ dara.

Gọọmenti mba Uk e kwuru gịnị?

Ha kwuru na Cumming gara ebe dị nso na bee ha dopu onwe ha makana ya na nwunye ya chọrọ idowe nwa ha ebe ọ ga-anata nchekwa zuru oke.

Benjamin Netanyahu

Ebe foto si, EPA

Aka na-achị mba Israel bụ Benjamin Netanyahu ga-azara ọnụ ya n'ụlọ ikpe taa bụ ụbọchị sọnde iri abụọ na anọ nke ọnwa Mee.

Nke a bụ mbụ onye nọ n'ọkwa ga-aga ụlọikpe na mba ahụ.

E boro Netanyahu ebubo mpụ, ịna aka azụ, nakwa imebi okwukwe e tinyere na ya dịka onyeisiala. ọ ganahụrụ ebubo ndị a niile.

Netanyahụ dị afọ iri asaa ajụla iritu n'ọkwa dịka ndị na-ama ya aka na-ekwusi ike ka o rituo n'ọkwa ya wee ga zaragodu ọnụ ya n'ụlọikpe.

Israel

Ebe foto si, Getty Images

Ebubo ndị a na-abịa dịka Netanyahu werechara oche dịka onyeisi gọọmenti chịkọtara ndị mba ahụ, a na-enwebeghị ka mgbe.

Onye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Benny Gantz ya na ya na-ama aka kwetere ikesa ikike ọchịchị kamgbe mpụtara ntụliaka atọ n'otu afọ edochaghị ndị mmadụ anya ọfụma.

Netanyahu ga-azara ọnụ ya na "Jerusalem District Court."

Cheta na ọ bụ praim mịnista kacha nọ n'oche ọchịchị karịa ndị chiburala mba ahụ dịka ọ malitere chịwa Israel kamgbe afọ 2009.

Kedụ udiri nrụrụaka a na-ebo Netanyahu?

E kere ebubo a ụzọ atọ kpọ ha 1000, 2000, 4000.

  • 1000 gụnyere na Netanyahu natara onyinye mmanya ọkụ na siga n'aka ndị azụmahịa ama ama ka ha we mere ya ihe pụrụiche anaghị emere ndị ọzọ.
  • 2000 gụnyere na Netanyahu kwetere ịkwado ụlọọrụ mgbasa ozi akpọrọ Yediot Ahronot, ka ha were na-ede naanị iheọma maka ya , hapụ idepụta ihe ọjọ o mere.
  • 4000 gunyere na Netanyahụ na-akwado ụlọọrụ ikuku ekwenti ga na-akwado ọfụma ụlọọrụ mgbasa ozi Elovitch's Walla.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: