Trump ga-aza ajụjụ maka ịhe nrụrụaka eboro ya gbasara Russia

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Onyeisiala mba United State bụ Donald Trump ekwetala na a ga agba ya ajụjụ ọnụ maka ịhe nrụrụaka a na-ebo ya n'ihe gbasara ndị Russia ị tinye aka na mmeri o meriri na-ntuliaka dịka onye isiala mba America.
Prezident Trump sịrị na ọ na-atu anya na-onye isi ndị Justice Department bụ Robert Mueller ga agba ya ajụjụ ọnụ n'ịme izu uka abụọ ma ọ bụ atọ n'abia.
Ọ sịkwa na ya "na-atụ anya ka eme ya ngwangwa".
Trump sịbụ na ya echeghị na Mueller ga agba ya ajụjụ ọnụ.
Ọ sịbụ na ya bụ ị gba ajụjụ ọnụ bụ "nkata ndị ịro na-akpa" megide ya.
Ugbua Trump na-ekwusị ike na ya dị nkwadebe maka ya bụ ajụjụ ọnụ ma edoo ya na-iyi.
Cheta na ndị ọrụ US na-eme nchọpụta akpọrọ intelligent agencies kwenyere na aka ndị Russia dị na-mmerị Trump meriri Hillary Clinton na ntuliaka mba US.
Nchọpụta e megoro na ya bụ okwu
Ka ọ dị ugbua, a maala mmadụ anọ ikpe bụ ndị a chọpụtara an-aka ha dị na ya bụ mpụ.
Onye mbụ ejidere bụ Michael Flynn bụ onye ọrụ achụrụachụ na-enyere Trump aka maka nchekwa obodo.
Flynn tụụrụ ndị FBI asị na ya amaghị ịhe gbasara mmekọ ndị Russia na-ntuliaka nke USA.
Mana ọ mechara kweta.
Ọ yọwakwara biko ka e mere ya ebere ka ya nyere ha aka n'ime ya bụ nchọpụta.
Onye ọzọ a chọpụtakwara aka ya dị na ya bụ okwu bụ nwa Trump bụ Donald Jr a sị na ya na onye Okaikpe ndị Russia mekọrọ mgbe nna ya na-eme ndọrọndọrọ ọchịchị.
George Papadopoulos bụ otu n'ime ndị ndụmọdụ Trump kwetakwara na ya tụọrọ FBI asị maka ya bụ aka enwe n'ofe ndị America.
Ndị ọzọ a na-enyocha bụ ọgọ Trump bụ Jared Kushner nakwa Paul Manafort bụ onye a na-ebo n'onwere ka ya na ego siri ga, mana okwua agbasaghị ntuliaka emere n'America.








