Coronavirus in America: Trump ekwuputala ọrịa coronavirus dịka ọrịa gbatagbata na America

Donald Trump nke mba Amerika

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

Onyeisi mba Amerika bụ Donald Trump ehiwela ọnọdụ ọtawike akpọrọ "national Emergencey' na Bekee na mba Amerika.

Ihiwe ọnọdụ gbatagbata n'ihe ọbụla na-enye aka ka gọọmenti mụchie anya wepụta ọkpụrụkpụ ego iji memila ya bụ ihe.

Mba Amerika akwadobughị akwado maka ọrịa coronavirus, mana ugbua ọkpa ha abụọ nọzị na ya bụ agha otu mgbe.

Ọ kwelarị nkwa na ya ga-ewepụtakwu akụrụngwa eji enyocha ya bụ ọrịa dịka ọ na-akọtọ ndị ọrụ nyocha nje ala ahụ akpọro Centre for Desease Control (CDC).

Akụrụngwa ndị a ga-eru otu nde na ụma anọ n'ọgụ n'otu izuụka na-abịa ma mezuo ya nde ise mgbe o ga-eru otu ọnwa.

Trump kwuru na ebum n'obi ya bụ ịkwụsị mgbasa ya bụ ọrịa kpam kpam.

Yemi Osinbajọ

Ebe foto si, Yemi Osinbajo/Twitter

Nkọwa foto, Yemi Osinbajo enweboola ihe mberede ụgbọelu na Febuwarị 2019

Akụkọ na-eru anyi nti ugbua na-ekwu na otu n'ime otu ndị ọrụnchekwa na-eso Osote onyeisiala, Yemi Osinbajo, eme njem nwuru n'ihe mberedeokporo ụzọ na ụzọ ka ha na-aga ọdọụgbọelụ Nnamdi Azikiwe ụbọchị Fraịda.

Ya bụ nwoke aha ya bụ Ali Gomina gbara afọ iri anọ na ise nwuru na ya bụ ihe mberede dịka ọnụ na-ekwuru Osinbajo bụ Laolu Akande si kwuo.

O kwukwara na obi ọjọọ ya bụ ọnwụ ike ekweghịzị Osinbajo metọpụ ya bụ njem.

Osote onyeisiala, Yemi Osinbajo kọwara ya bụ nwaamadị dịka onye na-arụsi ọrụ ya ike mgbe ọ dị ndụ.

Gomina nụrụ nwaanyị mụkwa ụmụ.

Ike Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu Twitter

Ndị nnọchite anya ọwụwa anyanwu n'ụlọomeiwu Naịjrịa ekwuola ka e tinye ala Igbo na ndị ga-erite uru n'ijeri dọla iri abụọ na abụọ Naịjirịa chọrọ ibite mba Chaịna.

Ike Ekweremmadu na ndị otu ya ndị ọzọ gwaara ndị ntaakụkọ nke a n'Abuja ụbọchị tọzde.

Ndị omeiwu a bugaara ndịisi ụlọomeiwu ukwu na nke nta bụ Ahmed Lawan na Femi Gbajabiamila mkpesa a.

Nke a na-abịa dịka ndị otu sinet binyegoro aka na ya bụ akwụkwọ onyeisiala Muhammadu Buhari wetere ha kemgbe ka ha kwado ibite ya bụ ego.

Na-agbanyeghị nke a, ndị nnọchite anya ala Igbo sokwa ibe ha kwado nata ya bụ ego mbibi.

Ndị ụlọomeiwu nta etinyebeghị aka na ya bụ akwụkwọ ibite ya bụ ego.

Ekweremadu sị na "ha ekweela anyị nkwa itinye ndị Igbo dịka ndị ga-eso rite ya bụ uru n'ego ahu".

O kwukwara na ihe ejiri kwado ya bụ atutmatu na Sinet bụ na otutu n'ime ha anọghị mgbe akpara maka ya.

Ndị ntaakụkọ jụkwara ha ihe mere ha jiri mewezia gbanụgbanụ ugbua ebinyegoro aka na ya bụ akwụkwọ na Sineti.

Ndị otu a kọwatara na ha ka nwere ohere ịme ka Igbo nweta oke ha na ya bụ ego mbite.

Ndị so mee ya bụ njem ịhụ ndịisi ụlọomeiwu abụọ bụ Enyinnaya Abaribe, Rochas Okorocha, Ike Ekweremadu na ndị ọzo

Minista ahuịke na ọnọdụ Coronavirus na Naịjirịa

Osagie Ehanire

Ebe foto si, TWITTER/@FMOHNIGERIA

Nkọwa foto, Minista ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehanire

Minista ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehanire ekwuola na onye nke abụọ a sị na ọ nwere ọrịa coronavirus na Naịjirịa enweghịzị ya.

Osagie kwuru na ndị orụ ya ka gana enyocha ndị niile na abata Naịjirịa iji mata ọnọdụ ha maka coronavirus.

Ọ na-akpọ oku ka ndi ọrụ dị iche iche niile nwere ike itinye aka na ya bụ ọrụ pụta bịa soro buso ya bụ ọrịa agha.

N'Afrika,

Coronavirus na Etiopia

Ebe foto si, Reuters

N'Africa, ọrịa coronavirus abatala na mba Ethiopia.

Ya bụ ọrịa sị n'aka nwoke Japan sị Burkina Faso bata ebe ahụ.

N'ofesi,

British Aways

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọrụ British Airways ekwuola na ha ga achụ ndị ọrụ dịka coronavirus na-akụrụ ha ọrụ.

Nke a na-eme dịka ọnụọgụ ndị butegoro ọrịa a n'Uk rugoro narị asaa na ụma site na nari ise na ụma ọ nọ ụnyaahụ.

Asọmpi asọmpị bọọlụ ịkwaaka ndị Wales and Scotland

Weles na Scotland

Ebe foto si, Huw Evans picture agency

N'egwuregwu e, ọnụọgụgụ asmopi egwuregwu akagbugoro na mba ụwa maka ọrịa Coronavirus na-arị elu kwa ụbọchi.

Nke ikpeazụ ugbua bụ asọmpi egwuregwu ndị Scotland na Wales.

Njịrịmara ndị EPL

Ebe foto si, EPL

Ndị nzụkọ na aghazị Premier League ekwetela ka akwụsịtụ asọmpị Champions League tutu ụbọchị anọ nke Aprel 2020.

Ọ bụ onye isi Premier League bụ Richard Masters kwuru sị " Nke kachasị, anyị na-ekpe ekpere ka Mikel Arteta na Callum Hudson-Odion na ndị ọzọ ọrịa coronavirus ji nweta onwe ha".

Masters kwukwara na ha na otu bọọlụ premiership na arụko ọrụ, ndị FA na ndị EFL ị jị hụ na ahuike na ndụ ndị na-agba bọọlụ na echekwara ya nkeọma.

Champions League

Bọọlụ Champions League

Ebe foto si, Getty Images

Akwụsịtụla asọmpị Champions League na Europa maka ọrịa Coronavirus.

Agaghi emezikwa eji ahọpụta ndị ga-eso na asọmpi ọzọ ehiwere n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Machị.

Dịka ọ dị ugbua, agaghị agba kwa asọmpị Manchester city na Real Madrid, Juventus na Lyon, Barcelona na Napoli, na nke Bayern Munich na Chelsea.

Sanusi Lamido Sanusi

Sanusi Lamido Sanusi

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọikpe enyela ikike ka gọọmentị Naịjirịa sọpụrụ ikike dịrị onye nke gbasara Sanusi Lamido.

Ulọikpe nyekwara Sanusi Lamido ikike ịga ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga, kama ọgaghị aga Kano steeti.

O kwuru ka ikpe a bido ọrụ na agafeghị ụbọchị atọ.

Ikpe ndị ọzọ ka a ga-ekpezi n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Machị , 2020.

Akụkọ si ala Afrịka

(Stock image) Nyocha ndị si njem anata

Ebe foto si, Other

Minista ahụike nke mba Gana bụ Kwaku Agyemang Manu kwuru na mmadụ abụọ ebutela ọrịa ahụ na mba ha.

O kwuru na mmadụ abụọ ndị a si mba Norway nakwa Turkey were bata Gana.

Na Gabon, ọ bụ otu onye bu ọrịa ahụ dịka ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị ha bụ Edgard Mboumbou Miyako si kwuo.

Nwoke ahụ bụ onye Gabon si mba Fransị bata ma kwuo na ha na-eleta ya ọfụma.

Ka o si kwụrụ n'Afrịka ugbua

Mba Ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa ahụ

Algeria 24

Burkina Faso 2

Cameroon 2

DR Kongo 1

Egypt 67

Gabon* 1

Ghana* 2

Ivory Coast 1

Morocco 6

Nigeria 2

Senegal 4

South Africa 17

Togo 1

Tunisia 7

N'akụkọ yiri ya

Praịm Minister mba Canada Justin Trudeau na nwunye ya bụ Sophie Grégoire Trudeau

Ebe foto si, Reuters

Nwunye Praim Minista mba Canada bụ Sophie Trudeau ebutela ọrịa Coronavirus ebe di ya bụ Justin Trudeau ejirila aka ya banye Quarantine.

Ọzọ, otu nwoke na-arụ na gọọmentị mba Brazil bụ Fabio Wajngarten ebutela Coronavirus. Nke a na-abịa dịka foto ya na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na osote ya bụ Mike Pence sere malitere ịfegharị na soshal midia

N'egwuregwu kwa, Michael Arteta onye nkuzi otu Arsenal nakwa Callum Hudson-Odoi onye ọgba bọọlụ nke Chelsea ebutela ọrịa Coronavirus.

Otu mbụ ndị nke Arsenal etinyela onwe ha na quarantine ebe ndị Premier League kpọrọ nzụkọ gbatagbata ị ma ihe ha ga-eme maka ọrịa a.

Na Naịjirịa,

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina ekwuola na ọ bụghị mwakpo ka awakporo onyeisiala Buhari na Kebbi steeti

Kama ọ kọwara na ọ bụ otu nwata nwoke ji obi aṅụri agbaga ekele onyeisiala ya.

Okwu ya na-abịa dịka ihe onyonyo na-efegharị gosiri ebe otu nwata nwoke gbasoro onyeisiala dịka ọ na-akwado ise foto.

Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile