Coronavirus cure: A rụpụtala ọgwụ mgbọrọọgwụ maka coronavirus na Naịjirịa?

Ebe foto si, ABS
Mịnịstrị na-ahụ maka sayensị na nka na ụzụ (Federal Ministry of Science and Technology-FMST) ekwuola na ha amaghị maka ọgwụ e mere maka ọgwụgwụ coronavirus nke e ji aha mịnịstrị ahụ mee.
Ọgwụ mgbọrọgwụ ahụ nke foto ya gbara na soshal midia ụbọchị Tọzde, enweghị akara gosiri na o nwere nkwado nke NAFDAC.
Mana o gosiri 'ginger','garlic' na mkpọrọọgwụ na mkpaakwụkwọ ndị ọzọ e jiri mee ya ma gosikwa na ọ bụ SHESTCO bụ ụlọọrụ nọ n'okpuru ministrị na-ahụ maka nka na ụzụ mere ya.
Sheda Science and Technology Complex (SHESTCO) bụ ngalaba na-ahụ maka nchọcha na mmepe obodo.
Ha nwere lab atọ; nke " Biotechnology' nke' Chemistry' nakwa nke 'Physics Laboratory.'
Mbọ BBC Igbo gbara inweta onyeisi ngalaba ahụ bụ Ọkammụta Paul Onyenekwe amịtaghị mkpụrụ dịka ekwentị ya agaghị aga mana ọnụ na-ekwuru mịnịstrị nka na ụzụ bụ Abdul Ganiyu Aminu kwuru na mịnịstrị ha amaghị maka ọgwụ ahụ.
Aminu sị na ihe e nyere ngalaba nọga n'ọkpụrụ FMST bụ ikike ime 'facemask', kemical a na-efe maka aka mgbochi ọrịa nakwa nnyocha maka Covid-19.
"O nweghị mgbe anyị mere ọgwụ maka ọgwụgwọ coronavirus."
N'otu aka ahụ, ụlọọrụ NAFDAC kwuru na ha edebanyebeghị aha ọgwụ ọbụla na Naijiria maka ọgwụgwọ coronavirus.
Akụkọ ga-amasị gị:









