International Nurses Day: "Ndị nọọsụ na-akọ asịrị nnukwu" na ihe ndị ọzọ ndị Naịjirịa ji echeta ha taa

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị 12 nke ọnwa Mee bụ ụbọchị e wepụtara maka icheta ndị nọọsụ n'ụwa niile.
Ndị nọọsụ na-agba mbọ n'inyere ndị dọkịta aka n'ihe gbasara ilekọta ahụike ndị e tinyere ha n'aka.
Mana kedụ etu ndị Naịjirịa si ahụta ndị nọọsụ na-arụ ọrụ na Naịjirịa?
BBC Igbo jụrụ ajụjụ a na soshal midia Facebook na Instagram, ụfọdụ kwadoro ọrụ ọma ha na-arụ, ebe ndị ọzọ kwuru na ụfọdụ n'ime ha anaghị arụ ọrụ etu ndị nọọsụ kwesịrị isi arụ.
Ụfọdụ ihe ha kwuru gụnyere "Ndị nọọsụ na-akọ asịrị", "ndị nọọsụ enweghi ndidi nke ha ji enwe obi ọmiiko".
Ndị ọzọ kwuru sị na "ha kwesịrị iji obi mmadụ na obi Chineke arụ ọrụ ha"
Mana ndị nke ọrụ ndị nọọsụ na-amasị nke ọma gara n'ihu kpeere ha ekpere, ma sị ka Chineke gbaa ha ume ma nye ha ike ha ji arụsi ọrụ ha ike.
Lee ajụjụ a jụrụ ha na etu ha si zaa ihe ha zara ebe a:
Lee tu ha si zaa ya n'Instagram:
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










