Recession: Gịnị ka ọ pụtara?

Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa abanyela ọtanisi ọzọ dịka ụlọrụ National Bureau of Statistics (NBS) si kwupụta ụnyahụ bụ Novemba 21,2020.
Nke a ga-eme ugboro abụọ Naịjirịa na-abanye ọtanisi dịka onyeisiala Buhari chịrịla ruo afọ ise.
Ọtanisi mbụ okpuruọchịchị ya ugbua mere n'afọ 2016.
Ihe recession pụtara
Ndalata Akụ maọbụ "Recession" n'okwu bekee bụ ihe ọtụtụ mba achọghị iji ntị ha nụ na ọ na-eme na mba ha. N'oge coronavirus a, ụfọdụ mba ndị gunyere Jamanị, Fransị na Italị abanyela ya bụ oge ndalata akụ.
Ụfọdụ ndị ọkammụta n'ihe gbasara akụnụba obodo kwuburu na n'oge na adịghi anya na Naijirịa nwere ịke ịdabanye na ndalata akụ.
Oge ndalata akụ na-abụkarị oge ihe isi ike nye mmadụ niile. Dịka ị nwere ike ibido ị nụ akụkọ maka ndalata akụ a maọbụ "Recession" n'ihe mgbasa ozi dị iche iche, ka anyi kọwara gị ihe bụ ndalata akụ a.
Iji nweta elele dị n'akụkọ a, BBCIgbo kpọrọ ndị ọnụ na-erute n'okwu maka ihe gbasara akụnụba obodo bụ Anthony Agbo na Okechukwu Okere.
Gini bụ Ndalata Akụ (Recession)
Mazị Anthony Agbo kọwara Ndalata Akụ dịka oge akụnụba mba na-agbada agbada. E ji ya atule etu achụmta ego si a ga na mba.
Mazị Okechukwu Okere kọwara na ọ na-abụ ọnwa atọ gara n'usoro ka a na-atule ma ụba mba ọbanyela ndalata akụ. Ọnwa ndị a na-abụkarị ọnwa Machị, Jun,Sepụtemba na Dịsemba.
Ọ bụrụ na achụmta ego na ụba obodo na-agbada site na ọnwa atọ banye ọnwa atọ ndị a, ị mara na mba ahụ abanyela ndalata akụ.
Ụfọdụ ihe na egosipụta Ndalata Akụ bụ :
- A na-achụ ndị mmadụ n'ọrụ ebe ọtụtụ anaghị enweta ọrụ
- Ihe na-egosipụta etu mba sị akpata ego bụ "Gross Domestic Product" na-agbatu
- Ọnụ ahịa ihe na-agbago
- Ụlọọrụ ndị na-arụpụta ihe anaghịzị arụ etu ha sị arụ.
Ihe ndị a gafee ọnwa atọ na-esọ ibe ya n'azụ nke bekee kpọrọ 'quaterly' ị mara na mba ahụ abanyela ọnọdụ ndalata akụ.
Naijirịa ọ nọ na ndalata akụ ka anyị a ga-adanye nsonso a

Ebe foto si, Getty Images
Agbo kwuru na n'uche nke ya, na Naijirịa abanyela oge ndalata akụ dịka ihe niile na-egosi na mba abanyela ọnọdụ a na-egosi.
N'aka nke ọzọ ka Okere na-akọwa na ọ bụ mgbe Naijirịa nọrọ ọnọdụ a n'ime ọnwa isii ka e nere ike ị sị na ọbanyela ndalata akụ.
Kama Okere kwuru na n'ụche obi ya na Naijirịa nwere ike ịdanye na ndalata akụ n'ihi na ego mmanụ agbidi agbdaala na mba ụwa maka ọrịa coronavirus.
O kwuru sị " Etu gọọmentị si enyere akụnụba mba aka bụ iru ihe dị cihe cihe dịka ụzọ na ihe ndị ọzọ nke na-eme ka ego bata n'aka ndị mmadụ mana ọ bụrụ na ha ereteghị ego site na mmanụ agbidi, ọ ga-esi ike ike nke a".
Kedụ etu mmadụ ga-esi kwado maka ya.

Ebe foto si, Getty Images
Agbọ kọwara na ụfọdụ ihe mmadụ ga-eme iji gbanahụ ịda ụbịam oge ndalata akụ gụnyere
- Ibelata ego ole ị na-emefu ma wepụ nke na adịghị oke mkpa
- I kwụ ụgwọ ego ị bitere, n'ihi na i ji ụgwọ oge ndalata akụ bụ oke ibu
Okere kwuru na ị sị ndị mmadụ jichie ego ha ga-eme ka ndalata akụ dakwasị Naijirịa kama ọ kwuru dịka Agbo si kwuo ka mmadụ niile wetulata aka n'ego ha na-emefu.
Gọọmentị e nwere ihe ha kwesiri ime?
Okere kọwara na gọọmentị kwesiri ibido ugbua tinye aka ịkwalite akụkụ akụnụba Naijirịa ndị ọzọ n'ihi na mmanụagbidi enwereike ọgaghị azọ anyị.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ mara atụ sị " gọọmentị mepee njem na imepụta ọkụ Latrịk ka ndị ụlọọrụ nọrọ onwe banye na ya ga-eme ka ụlọọrụ ndị a nye ndị mmadụ ọrụ ma mee ka akụnụba Naijirịa gbalite".
Okere kwukwara na gọọmentị nwere ike ibite ego iji nyere ụlọọrụ dị iche iche aka iji kwalite akụnụba Naijirịa.









