Covid-19: I nwereike ibute coronavirus site n'ahụrụ?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Dịka ọria coronavirus na-akpa ike na-aga n'ihu na Naijiria na mbaụwa, kepukepu ọhụrụ na- efegharị na-ekwu na e nwere ike ibute ọria ọjọọ a site n'ahụrụ.
Mana ndị ọkachamara ahụike gwara BBC lgbo na mkpụrụ adịghị n'ụkwa a ndị na-efesa akụkọ na-apị.
Kemgbe ọrịa coronavirus pụtara mbụ na Chaịna n'afọ 2019 rue ugbua, ọria a nke ndị ọkachamara kwuru na a na-ebute site n' ụkwara maọbụ azụzụ ma a kwaa ụkwara maọbụ maa uzere, ataala isi otu ijeri mmadụ na ụma n'ụwa nile.
Aka nile dị n'ọbọ ime nchọpụta maka ọgwụ mgbochi coronavirus, ọgwụgwọ, nakwa etu ndị ọzọ ọrịa a si ekesa.
Otu ndọrịtaụka ọhụrụ pụtara n'ịntanet nke bụ otu dọkịta akpọrọ Andy Tagg malitere na nsonso bu nkwenye ụfọdụ na mmadụ nwere ike ikuru coronavirus n'ahụrụ onye bu ọrịa a nyụrụ, ọkachasị onye eyighị ọbante.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Mana ọkachamara n'ihe gbasara nje (virologist), Ọkammụta Oyewale Tomori sị na, "onye na-ekwu ụdị okwu a na-ama njakịrị."
"E nwere ike ịhụ nje a na ngụ (lung,) nakwa akụkụ ndị ọzọ e ji eku ume."

Ebe foto si, OYEWALE TOMORI-fb
Dọkịta ahụike ọha n'ụlọọgwụ 'Lagos University Teaching Hospital' (LUTH), bụ Dkta Bayo Onajole nakwa odeakwụkwọ otu jikọrọ ndị sayentist na Naijiria a kpọrọ 'Nigeria Academy of Science' (NSA) bụ Dkta Doyin Odubanjo kwenyere n 'ihe Tomori kwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Onajole sị na, "ọ bụghị eziokwu", ebe Odubanjo si na "anụbeghị m ya mbụ".
Odubanjo na Tomori kwuru na ihe ha ma bụ na nchọpụta na-egosi na nje coronavirus nwere ike ịnọ na nsị.
Tomori, onye bubu onyeisi NAS sị, "n'ezie, e nwere ike ịhụ ya na nsị."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
N'otu aka ahụ, Dkta Odubanjo si, "nchọpụta na-ekwu na-enwere ike ibute ya na nsị onye bu nje ahụ ọbụladị ogema nnyocha kwuorola na ọ gbakela".

Ebe foto si, DOYIN odubanjo /fb
"Ya mere o ji dị mkpa ịkwọ aka ọfụma ma ị gachaa ụlọmposi."
Mana Onajole ekwetaghị na e nwere ike ibute nje coronavirus na nsị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
O kwuru na coronavirus bụ "ọrịa ọwa e si eku ume,(gastro-intestinal tract), ọ bụghị ọrịa nsi na nsị aba n'ọnụ (fecal-oral)".
Dịka coronavirus bụ ọrịa ọhụrụ a ka na-enyocha, ndọrịtaụka ka aga n'ihu rue oge nchoputa zuru oke ga-ewepụ mgbagwojuanya nile.