Ahụrụ ili nwaagbọghọ a n'okpuru akwa enyi ya nwoke

AAUA na Ogun Steeti

Ebe foto si, Khadijat Oluboyo/Fb

Nkọwa foto, Adenike Khadijat Oluboyo na-agụbu akwụkwọ na Adekunle Ajasin University bụ ebe o kwesiri ịpụta n'afọ ọzọ.

Ka ọ gachara abalị atọ achọwara Adenike Khadijat Oluboyo ka ndị ụweojii hụrụ ozu ya na ụlọ enyi ya nwoke bụ Adeyemi Alao ebe ha sị na o niri ya na'okpuru akwa ya.

Ihe a mere na Adekunle Ajasin University bụ ebe nwa agbọghọ a na-aga akwụkwọ bụ nke ọ nọ n'afọ nke anọ ya.

Ndị uweojii gwara BBC na ha magidere imi n'ala were gwuputa ozu Khadijat Oluboyo na ili ebe Adeyemi Alao niri ya n'ime ụlọ ya nke ndị na Akure.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ondo steeti bụ Femi Joseph kwuru na ndị be Khadijat Oluboyo nke bụ nwa osote gọọvanọ ndị Ondo steeti chiburu nọ na afọ nke anọ ya n'ụlọ akwụkwọ mahadum AAU.

AAUA na Ogun Steeti

Ebe foto si, Khadijat Oluboyo/Fb

Nkọwa foto, Adenike Khadijat Oluboyo

Okwukwere na oteele ndị be ha chọwara ya bụ nwaada achọ.

Joseph kwukwara na aka ha akpalara Alao bụ onye a na ebo ebubo a ma n'emekwa nnyocha dị na ya.

Okwekwara nkwa na ha ga na agwa BBC okwu dị ihe si apụta na ya bụ ihe.

Adenike Khadijat Oluboyo bụ nwa Lasisi Oluboyo nke bụbu osote aka na achị Ondo steeti mbu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Akụkọ kachasị tata